Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 30:6 - Bible Nso

6 Ibu eboro anumanu nile nke Negeb. N'ala ahuhu na nkpà, ebe nne-ọdum na oke-ọdum na aju-ala na agwọ yiri ọku nēfe efe si abia, ka ha nēbu àkù-ha nile n'ubu umu-inyinya-ibu, na ihe-ha nile di oké ọnu-ahia n'okpu-azu camel, ijekuru otù ndi nāgaghi-abara ha urù.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Amụma banyere ụmụ anụmanụ bi na Negev. Nʼala ahụhụ na mkpagbu, nke ọdụm na nne ọdụm, nke ajụala na agwọ ọjọọ na-efe ka ọkụ, ndị nnọchite anya obodo na-ebu akụ ha niile nʼelu ịnyịnya ibu, na-ebukwa akụnụba ha dị oke ọnụahịa nʼelu ịnyịnya kamel, na-agakwuru mba ahụ na-abaghị uru,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 30:6
31 Iomraidhean Croise  

Abram we bulie ije, nēje nēbuli kwa ije n'uzọ Negeb.


Ọ biarue Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo bara uba nke-uku, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, gwa ya okwu nile nke di ya n'obi.


Esa we weputa ọla-ọcha na ọla-edo n'àkù ulo Jehova na nke ulo eze, zigara Ben-hedad, bú eze Siria, onye bi na Damaskọs, si,


Ma eze-nwayi Sheba nuru akukọ Solomon, we bia iwere ilu di iche iche nwa Solomon nime Jerusalem, ya na usu di ọtutu nke-uku, na camel nēbu uda di iche iche, na ọla-edo n'uba, na nkume di oké ọnu-ahia: o we biakute Solomon, kpayere ya uka nile nke di ya n'obi.


Ì gātukwasi ya obi n'ihi na ike-ya riri nne? Ma-ọbu ì gārapuru ya ndọb͕u i nādọb͕u onwe-gi n'ọlu?


ha we were òfùfè siri ike me ka ndu-ha di ilu, n'urọ, na nime brick, na n'òfùfè nile ọ bula n'ọhia, òfùfè-ha nile nke ha mere ka ha fè nime ha di na nkpab͕u.


Aṅurila ọṅu, gi Filistia, ka i ra, n'ihi na anyajiwo ndele nke nēti gi-ri: n'ihi na ihe nke gēsi na nkpọrọgwu agwọ puta bu ubí, nkpuru-ya gābu kwa agwọ yiri ọku nēfe efe.


N'ihi nka ihe o nwebigara ókè nke o nwetara, na ihe ha kpakọbaworo, n'ofè iyi osisi willow ka ha gēbulaga ha.


M'gēmechibido Ijipt n'aka onye-nwe-ha nēme ihe-ike; eze di ike gāchi kwa ha, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.


Ọ dighi ọdum gādi n'ebe ahu, ọ dighi kwa anu-ọhia nke di irè gārigo n'elu ya, agaghi-ahu ya n'ebe ahu; ma ndi emeworo ka ha nwe onwe-ha nēje ije n'ebe ahu:


Ha gēbib͕ọ kwa megide ya n'ubọchi ahu dika nbib͕ọ nke oké osimiri: asi kwa na madu elegide ala anya, le, ọchichiri di; nkpà na ìhè; ọ b͕awo ọchichiri n'igwe-oji-ya nile.


I we were manu jegharikuru eze ahu, i me-kwa-ra manu-otite-gi nēsì ísì utọ ka ha ba uba, i zi-kwa-ra ndi-ukọ-gi n'ebe di anya, i we me onwe-gi ka i di ala rue ala-mọ.


ala ka ha gēlegide kwa anya, ma, le, ahuhu na ọchichiri, bú nb͕achi nke nkpà; ọ bu kwa oké ọchichiri ka aganēnupu ha bà.


nke M'nyere nna-unu-hà n'iwu n'ubọchi M'mere ka ha si n'ala Ijipt, si n'oké ọku ígwè ahu, puta, si, Genu nti olum, me ha, dika ihe nile si di nke M'nēnye unu n'iwu: unu ewe burum otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra unu Chineke:


Ha asighi kwa, Òle ebe Jehova nọ, bú Onye meworo ka ayi si n'ala Ijipt rigoputa; Onye meworo ka ayi je ije n'ọzara, n'ala nke ebe ihe nādighi na nke olùlù, n'ala ọkpọ-nku na nke onyinyo ọnwu, n'ala nke ọ nādighi onye gabigara nime ya, na nke madu nēbighi n'ebe ahu?


Nwa nke madu, che iru-gi n'uzọ Ndida, me ka okwu-gi busa dika miri-ozuzo n'ebe Ndida di, bue amuma megide oké ọhia nke ọhia ahu di na Negeb;


Efraim ji ifufe azù onwe-ya, ọ nāb͕aso kwa ifufe Iru-anyanwu: ogologo ubọchi nile ọ nēme ka okwu-ugha na nbibi ba uba; ha na Asiria nāb͕a kwa ndu, anēbuga kwa manu n'Ijipt.


Jehova nwe-kwa-ra ikpe Ya na Juda gēkpe, Ọ gēji kwa nmehie Jekob leta ya dika uzọ-ya nile si di; dika omume-ya nile si di ka Ọ gēnyeghachi ya.


Gi onwe-gi gēri ihe, ma afọ agaghi-eju gi; afọ-awọrọ-gi gādigide kwa nime gi: i gēwezuga kwa ndi-gi, ma i gaghi-eme ka ha b͕apu; ma ndi i nēme ka ha b͕apu, ọ bu mma-agha ka M'gēwere ha nye.


Ub͕ọ-ala ahu nke inyinya nēji nji di nime ya nāpuru ala Ugwu; nke nācha ọcha puso-kwa-ra ha; nke turu agwa puru-kwa-ra ala Ndida.


Tegharia egwú ọṅù nke-uku, gi ada Zaion; tie nkpu, gi ada Jerusalem: le, eze-gi nābiakute gi: onye ezi-omume na onye nwere nzọputa ka ọ bu; onye ewedara n'ala, nke nānọkwasi kwa n'inyinya-ibu, ọbuná na nwa-inyinya, bú nwa-inyinya-ibu.


Jehova we si Moses, Mere onwe-gi agwọ yiri ọku, tukwasi ya n'ọkọlọtọ: o gēru kwa, na onye ọ bula ataworo gādi ndu, mb͕e ọ huworo ya anya.


Agēme ka eze-nwanyi nke Ndida so ọb͕ọ a bilie n'ikpé ahu, ọ gāma kwa ya ikpé: n'ihi na o siri n'ebe uwa sọturu bia inu amam-ihe Solomon; ma le, Onye ka Solomon nọ n'ebe a.


Nání na ọ gaghi-eme ka inyinya bara ya uba, ọ gaghi-eme kwa ndi Israel ka ha laghachi n'Ijipt, ka o we me ka inyinya ba uba: n'ihi na Jehova asiwo unu, Unu alaghachi-kwa-la n'uzọ ahu ọzọ.


Ma Jehova ewerewo unu, me ka unu si n'oké ọku ígwè ahu, bú Ijipt, puta, iburu Ya ndi nketa, otú ọ di ta.


Onye nēme ka i je ije n'ọzara uku ahu nke di egwu, nke agwọ nke yiri ọku na akpi di nime ya, na ala akpiri-ikpọ-nku nke miri nādighi ya; Onye nēme ka miri si n'oké nkume ọmu ahu putara gi;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan