Eze Asiria we hu nkekọta-madu imegide ya n'aru Hoshea; n'ihi na o zigara So, bú eze Ijipt, ndi-ozi, ma o bugoghi onyinye-inata-iru-ọma inye eze Asiria, dika ọ nēme kwa-arọ: eze Asiria we mechibido ya, ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ.
Nání ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha ka ndi-isi Zoan bu; ndum-ọdu nke ndi mara ihe nime ndi-ndum-ọdu Fero aghọwo ndum-ọdu anu-ọhia: ùnu si aṅa si Fero, Nwa ndi mara ihe ka m'bu, nwa ndi-eze nke mb͕e ochie?
I we were manu jegharikuru eze ahu, i me-kwa-ra manu-otite-gi nēsì ísì utọ ka ha ba uba, i zi-kwa-ra ndi-ukọ-gi n'ebe di anya, i we me onwe-gi ka i di ala rue ala-mọ.
Ọ bu kwa na Tehafnehes ka ubọchi gāb͕a ọchichiri, mb͕e M'gāb͕aji yoke nile nke Ijipt n'ebe ahu, npako nke ike-ya gākwusi kwa nime ya: ya onwe-ya, igwe-oji gēkpuchi ya, umu-ya ndinyom gāla kwa na ndọta-n'agha.
Ha nālaghachi, ma ọ bughi Onye nọ n'elu ka ha nālaghachikute; ha di ka uta nāghọ aghughọ: ndi-isi-ha gāda site na mma-agha, site n'oké iwe nke ire-ha: nka bu ikwa-emò-ha n'ala Ijipt.
Ọhù Obadaia. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri bayere Edom: Ayi anuwo ihe-ọnunu sitere n'ọnu Jehova, ezigawo kwa ukọ̀ n'etiti mba nile, si, Bilienu, ka ayi bilie imegide ya n'agha.