Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 30:33 - Bible Nso

33 N'ihi na edowo otù Tofet n'usoro site na mb͕e gara aga; e, nke ahu ka edoziworo nye eze; O mewo ya ka ọ di omimi, me ya ka ọ sa mbara: obo-ya bu ọku na ọtutu nkú; nku-ume Jehova, dika iyi brimstone, nāfunwu ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Edoolarị ihe niile nʼusoro site nʼoge gara aga. A kwadoola ebe a ga-akwanye ọkụ nke ga-erechapụ eze ahụ. Ọ bụ ebe sara mbara, nke dị omimi, na nke a kwajuru nkụ. Ọ bụ iku ume Onyenwe anyị nke dịka mwụpụta nke nkume na-enwu ọkụ ka a ga-eji mụnye ya ọkụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 30:33
30 Iomraidhean Croise  

Jehova we me ka brimstone na ọku si n'elu-igwe zokwasi Sọdọm na Gọmọra dika miri site n'ebe Jehova nọ;


O meru-kwa-ra Tofet, nke di na ndagwurugwu umu Hinom, ka nwoke ọ bula we ghara ime ka nwa-ya nwoke ma-ọbu nwa-ya nwayi gabiga nime ọku rue Molek.


Site n'iku-ume Chineke ka ha nāla n'iyì, Site kwa n'ifufe nke iwe-Ya ka anēme ka ha gwusia.


Ìhè Israel gāghọ kwa ọku, Onye Nsọ ya gāghọ kwa onwunwu-ọku, we re ọku richapu uke-ya na ogwu-ya n'otù ubọchi.


kama ọ gēji ezi omume kpe ndi nēnweghi ike ikpe, ọ gēji kwa izi-ezi ba nba bayere ndi di ume-ala n'obi n'uwa: ọ gēji kwa ndele nke ọnu-Ya tib͕ue uwa, ọ gēji kwa iku-ume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua me ka ndi nēmebi iwu nwua.


Nkume-ya nke di elu gāgabiga site n'ujọ, ndi-isi-ya gātu kwa ujọ ọkọlọtọ, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Onye ìhè O nwere di na Zaion, ite-ọku uku O nwere di kwa na Jerusalem.


Ndi-nmehie nātu oké egwu nime Zaion; ọma-jijiji ejidewo ndi emeruru emeru. Ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nērichapu erichapu di? ònye n'etiti ayi gānọ dika ọbìa n'ebe ọku nēre ere ebighi-ebi di?


Iyi-ya nile gāb͕anwe pitch, ájá-ya gāb͕anwe kwa brimstone, ala-ya gāghọ kwa pitch nēre ọku.


O rue, mb͕e ya onwe-ya nākpọ isi ala n'ulo Nisrok, bú chi-ya, na Adramelek na Shareza, bú umu-ya ndikom, were mma-agha tib͕ue ya: ma ndi ahu wepugara onwe-ha la n'ala Ararat. Isa-hadon, bú nwa-ya, we buru eze n'ọnọdu ya.


N'ihi na, le, Jehova gēji ọku bia, ub͕ọ-ala-Ya nile gādi kwa ka oké ifufe; iji ọnuma nyeghachi iwe-Ya, na iji ire ọku nyeghachi ibasi-nba-ike-Ya.


n'ihi nka, le, ubọchi nābia, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), mb͕e agaghi-akpọ kwa ebe a Tofet ọzọ, ma-ọbu Ndagwurugwu nwa Hinom, kama agākpọ ya Ndagwurugwu Ob͕ub͕u.


Bìenu onwe-unu úgwù nye Jehova, bìenu onwe-unu úgwù n'obi, unu ndikom Juda na ndi bi na Jerusalem: ka ọnuma m we ghara ipu dika ọku, we re nke ọ nādighi onye nēmenyu, site n'ihe ọjọ nke omume nile unu.


M'gāwukwasi gi ajọ iwem; ọku nke nrubiga-ókè nke iwem ka M'gēji fùkwasi gi: M'gēnye kwa gi n'aka ndikom bu nání anu-ọhia, ndi di ǹkà n'ibibi ebibi.


Eze ahu gēme kwa ka o si tọ ya; ọ gēbuli kwa onwe-ya, me onwe-ya uku n'elu chi nile ọ bula, ọ bu kwa Chineke nke chi nile ka ọ gēkwu oké okwu di iche iche megide: ọ gāga-kwa-ra ya nke-ọma rue mb͕e oké iwe gāgwusi; n'ihi na ihe akara àkà gēme.


Osimiri nke bu ọku nērùputa n'iru ya: orú nnù ndi-ozi ọgu uzọ isi na uzọ ise nējere Ya ozi, orú nnù orú nnù uzọ, na orú nnù nnù uzọ iri-na-otù, na orú nnù ọgu uzọ ise, nēguzo kwa ọtọ n'iru Ya: Onye-ikpe ahu nọduru ala, asaghe-kwa-ra akwukwọ di iche iche.


Mb͕e ahu Ọ gāsi kwa ndi nọ n'aka-ekpe-Ya, Puanu n'irum, ndi anābu ọnu, ga n'ọku ebighi-ebi ahu nke edoziworo nye ekwensu na ndi-mọ-ozi-ya:


Ngwa ngwa ha we rapu ub͕ọ ahu na nna-ha, so Ya.


N'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, ọku nēripia eripia ka ọ bu, Chineke ekworo.


Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi.


Onye unu huru n'anya, ọ bu ezie na unu ahughi Ya anya; Onye unu kwere na Ya, ọ bu ezie na unu adighi-ahu Ya anya ub͕u a, obi we nātọ unu utọ nke-uku n'ọṅù nke anāpughi ikwu okwu nke enyewo-kwa-ra ya otuto:


N'ihi na madu ufọdu b͕ebàra, bú ndi ewereworo ha gosi ọra madu mb͕e ochie ka ewe ma ha ikpé a, ndi nādighi-asọpuru Chineke, ndi nāgha amara Chineke-ayi ka ọ buru agu ikwa-iko, ndi nāgọnari kwa Onye nání Ya bu Nna-nwe-ọra, na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan