Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 30:32 - Bible Nso

32 Ngabiga ọ bula nke nkpa-n'aka akara àkà, nke Jehova gēme ka ọ dakwasi ya, gādi kwa n'egwú-otiti na n'ubọ-akwara: ọ bu kwa n'agha di iche iche nke nfeghari ka Ọ gēbuso ha agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

32 Ihe otiti ọbụla nke Onyenwe anyị na-eji mkpọ ya, tie ha nʼahụ ga-adị ka egwu ụbọ akwara na une dị iche iche na-enye, mgbe ọ na-eweli aka ya na-eti ha oke ihe otiti dịka ọ na-alụso ha ọgụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 30:32
20 Iomraidhean Croise  

N'ìhi gini ka i b͕ala-gara na nzuzo, we ghọb͕uem? ọ̀ bụ kwa n'ihi gini ka i nēgosighm, ka m'we were ọṅù, were kwa abù, were kwa egwú-otiti, were kwa ubọ-akwara, zilaga gi?


nke nọyere ya bu ogwe-aka nke anu-aru; ma Nke nọyere ayi bu Jehova, Chineke-ayi, iyere ayi aka na ibu agha nile ayi. Ndi Juda we dabere onwe-ha n'elu okwu nile nke Hezekaia, bú eze Juda.


Anọm n'udo, O we mebiem; Ọzọ, O jidewo olum, piajisiam, Me ka m'biliere Onwe-ya ibu ihe O dotara ib͕a àkú.


N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Gi ndim nke bi na Zaion, atula egwu Asiria: ọ bu ezie na o ji ndele tie gi, weli kwa nkpa-n'aka-ya megide gi, otú Ijipt mere.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēfeghari kwa utali n'elu ya, dika ntib͕u Midian n'oké nkume Oreb: nkpa-n'aka-Ya gādi kwa n'elu oké osimiri, Ọ gēweli kwa ya otú O mere n'Ijipt.


Jehova gēwezuga ire oké osimiri nke Ijipt ka ebibie ya; Ọ gēji kwa okpom-ọku nke ifufe-Ya feghari aka-Ya n'elu Osimiri, tiputa ya iyi asa, me ka madu zọ ya ukwu n'akpukpọ-ukwu.


N'ubọchi ahu Ijipt gādi ka ndinyom: ọ gāma kwa jijiji tu kwa egwu n'ihi nfeghari aka nke Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nke Ya onwe-ya nēfeghari n'elu ya.


Madu gābà kwa n'ọb͕à nile nke oké nkume nile, na n'olùlù nile nke ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku.


Le, Jehova nāb͕aba uwa ọtọ, Ọ nēme kwa ka ọ tọb͕ọrọ n'efu, Ọ nēkpùta kwa ya iru, me ka ndi bi nime ya b͕asa.


Obi-utọ nke egwú-otiti nile akwusiwo, nkpọtu nke ndi nāṅuri ọṅu-agha agwuwo obi-utọ nke ubọ-akwara akwusiwo.


Abù ka unu gēnwe dika n'abali edoworo ememe nsọ; na ọṅù obi, dika nke onye ji ọ̀jà eje ibà n'ugwu Jehova, rue Oké Nkume nke Israel.


N'ihi na otú a ka Jehova sirim, Dika ọdum ma-ọbu nwa-ọdum, nke anākpọkọta ìgwè ndi-ọzùzù-aturu imegide ya, si ede inwù n'elu anu ọ dọb͕utara, ọ dighi-atu ujọ olu-ha, ọ dighi-eweda kwa onwe-ya n'ala n'ihi ùzù-ha: otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gāridata ibuso ugwu Zaion na ibuso ugwu ntà ya agha.


M'gēwu kwa gi ọzọ dika ulo, ewe wu gi, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú Israel: agēji kwa egwú-otiti-gi nile chọ gi nma ọzọ, i gēso kwa otite-egwú nke ndi nēgwuri egwú pua.


N'Iden, bú ubi Chineke ab͕ara ogige, ka i nọworo; nkume nile ọ bula nke di oké ọnu-ahia bu ihe-nkpuchi-gi: bú sardius, na topaz, na diamond, na beryl, na onyx, na jasper, na sapphire, na esmerald, na carbuncle, na ọla-edo: ije-ozi nke egwú-otiti-gi nile na ọ̀jà-gi nile di nime gi; n'ubọchi ekère gi, mb͕e ahu ka edoziri ha.


M'gēme kwa ka i ju ọtutu ndi anya, ndi-eze-ha gāma jijiji bayere gi nke-uku, mb͕e M'gēfeghari mma-agham n'iru ha; ha gāma kwa jijiji na ntabi-anya nile ọ bula, onye ọ bula n'ihi ndu-ya, n'ubọchi nke ọdida-gi.


Onye olu-Ya mere uwa ka o me nkpatu mb͕e ahu: ma ub͕u a ka O kweworo nkwa, si, Nání otù mb͕e ọzọ fọduru nke Mu onwem gēji me ka ọ bughi nání uwa ma jijiji, kama elu-igwe kwa.


Emesia i gābiaru ugwu ntà Chineke, ebe ebe-nguzo-ndi-agha ndi Filistia di: ọ gēru kwa, mb͕e i biara n'ebe ahu rue obodo ahu, na i gēzute usu ndi-amuma ndi si n'ebe di elu ahu nārida; une na egwú-otiti na ọja na ubọ-akwara di kwa n'iru ha; ndi ahu ganēbu kwa amuma:


O rue mb͕e ha nābia, mb͕e Devid si na ntib͕u onye Filistia ahu lata, na ndinyom siri n'obobo nile nke Israel puta, ibù abù na ite egwú, izute Sọl, chiri egwú-otiti, were kwa ọṅu, chiri kwa ubọ eji akwara atọ kwe.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan