Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 30:31 - Bible Nso

31 N'ihi na agēsite n'olu Jehova nyajisia Asiria, Ọ gēji ndele tib͕ue ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

31 Olu Onyenwe anyị ga-emenye ndị Asịrịa egwu; ọ ga-eji mkpara igwe ya kụdaa ha nʼala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 30:31
15 Iomraidhean Croise  

Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ, Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la. Ka udo dikwasi Israel.


Ọ gēru kwa, mb͕e Onye-nwe-unu gālubì ọlu-Ya nile n'ugwu Zaion na nime Jerusalem, na M'gēleta nkpuru nke oké obi eze Asiria, leta kwa ima-nma nke anya npako ya.


Anyu-ike, ọ̀ ga-egbu onwe ya n'aru onye ji ya eb͕u ihe? ma-ọbu mma-nkwọ, ọ̀ gēme onwe-ya uku megide onye nākwọ ya? dika agāsi na ndele gēfeghari ndi nēbuli ya, dika agāsi na nkpa-n'aka gēbuli onye nābughi osisi.


N'ihi nka otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri, Gi ndim nke bi na Zaion, atula egwu Asiria: ọ bu ezie na o ji ndele tie gi, weli kwa nkpa-n'aka-ya megide gi, otú Ijipt mere.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēfeghari kwa utali n'elu ya, dika ntib͕u Midian n'oké nkume Oreb: nkpa-n'aka-Ya gādi kwa n'elu oké osimiri, Ọ gēweli kwa ya otú O mere n'Ijipt.


Ahuhu gādiri Asiria, bú ndele nke iwem, nkpa-n'aka ka ọ bu kwa n'aka-ha, bú oké iwem!


kama ọ gēji ezi omume kpe ndi nēnweghi ike ikpe, ọ gēji kwa izi-ezi ba nba bayere ndi di ume-ala n'obi n'uwa: ọ gēji kwa ndele nke ọnu-Ya tib͕ue uwa, ọ gēji kwa iku-ume nke eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua me ka ndi nēmebi iwu nwua.


na M'gētipia Asiria n'alam, ọ bu kwa n'elu ugwum nile ka M'gāzọ ya ukwu: yoke-ya gēsi kwa n'olu-ha wezuga onwe-ya, ibu-ya gēsi n'elu ubu-ha wezuga onwe-ya.


Ọ̀ bu dika ntib͕u nke onye nētib͕u ya-ri ka O tib͕uworo ya? ma ọ̀ bu dika ob͕ub͕u nke ndi o nēb͕uri ka eb͕uworo ya?


Jehova gēme kwa ka anu ebube nke olu-Ya, Ọ gēme kwa ka ahu ndakwasi nke ogwe-aka-Ya, n'ọnuma nke iwe-Ya, na ire-ọku nke ọku nērichapu erichapu, na ntupia, na oké miri-ozuzo, na ákú-miri-ígwé.


Asiria gāda kwa site na mma-agha nke nābughi nke madu di elu: mma-agha nke nābughi nke madu di ala gērichapu kwa ya: ọ gēsi kwa n'iru mma-agha b͕alaga, umu-okorọbia-ya gāghọ kwa usu ndi nēfè òfùfè.


N'ihi na yoke nke ibu-ya, na nkpa-n'aka nke ubu-ya, bú ndele nke onye nāchi ya n'ihe-ike, I nyajiwo ha, dika n'ubọchi nke Midian.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan