Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 30:25 - Bible Nso

25 N'elu ugwu ọ bula di elu na n'elu ugwu ntà ọ bula di elu ka iyi na ebe miri nērù gādi, n'ubọchi nke oké ob͕ub͕u, mb͕e ulo-elu nile gāda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 Nʼelu ugwu ọbụla dị elu na nʼelu ugwu nta ọbụla dị elu, ka iyi na mmiri niile ga-eru, nʼụbọchị oke ogbugbu, mgbe ụlọ elu niile ga-ada.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 30:25
22 Iomraidhean Croise  

n'ihi na arapuwo ulo-elu; ab͕anariwo ìgwè obodo; Ofel na ulo nche anọchiwo n'ọnọdu ọb͕à rue mb͕e ebighi-ebi, ebe obi-utọ nke inyinya-ibu-ọhia, ebe-ita-nri nke ìgwè aturu di iche iche;


Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.


Akpiri akpọghi ha nku mb͕e O mere ka ha je ije n'ala kpọrọ nku: O mere ka miri si n'oké nkume rùputara ha: e, Ọ kpọwara oké nkume, miri we suputa.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mu onwem gēwere kwa ufọdu n'ọnu-ọnu osisi cedar di elu, kua ya; n'ọnu alaka-ya nke wara ọhu ka M'gākubipu alaka di nrò, Mu onwem gāku kwa ya n'elu ugwu di elu nke atuliri elu:


M'gēme kwa ka ha si na ndi nile di iche iche puta, M'gāchikọputa kwa ha n'ala nile, me ka ha ba n'ala-ha; M'gāzù kwa ha n'ugwu nile nke Israel, na n'akuku ebe nile miri si erù, na n'ebe-obibi nile nke ala-ha.


M'gēme kwa ka ha na ebe nile nke di ugwu ntàm buruburu ghọ ngọzi; M'gēme kwa ka oké miri-ozuzo zo na mb͕e-ya; oké miri-ozuzo nke ngọzi gādi.


O we me ka m'laghachi rue ọnu-uzọ ulo ahu; ma, le, miri nēsi n'okpuru nbata-uzọ nke ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu puta, n'ihi na iru ulo ahu di n'Iru-anyanwu: miri ahu nēsi kwa n'okpuru rùda, site n'akuku aka-nri nke ulo ahu, site n'akuku Ndida nke ebe-ichu-àjà.


Ọ gēru kwa n'ubochi ahu, na ugwu nile ganābusa manya-vine utọ, miri-ara ganērù kwa n'ugwu ntà nile, miri ganērù kwa n'ebe nile nke Juda miri si erù; isi-iyi gēsi kwa n'ulo Jehova puta, de ndagwurugwu Shitim.


Ebe-gi nile ewusiri ike gādi ka osisi fig nwere nkpuru-osisi fig buru uzọ cha: ọ buru na arùru ha arù, ha adabá n'ọnu onye nēri ha.


Miri nēsi n'ite-miri-ya nile rùputa, Nkpuru-ya gādi kwa n'ọtutu miri, Eze-ya gādi kwa elu kari Egag, Agēbuli kwa ala-eze-ya.


Onye nēkwere na Mu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ kwuru, n'afọ-ya ka osimiri nke miri di ndu gēsi nērùputa.


(n'ihi na ihe-agha nke ibu-agha-ayi abughi nke anu-aru, kama ha sitere na Chineke bu ihe puru ikwada ebe ewusiri ike);


O we gosim osimiri nke miri nke ndu, nēnwu dika crystal, ka ọ nēsi n'oche-eze Chineke na nke Nwa-aturu ahu puta,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan