Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 30:20 - Bible Nso

20 Onye-nwe-ayi gēnye kwa unu nri ahuhu na miri nmeb͕u, ma ndi-ozizí-gi agaghi-ezobe onwe-ha ọzọ, kama anya-gi abua ganāhu ndi-ozizí-gi:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Nʼagbanyeghị na Onyenwe anyị na-enye unu achịcha nke nhụju anya na mmiri nke ahụhụ, ndị ozizi unu agaghị abụkwa ndị zoro onwe ha ọzọ, kama unu ga-eji anya unu hụ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 30:20
17 Iomraidhean Croise  

Igāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n'ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m'gābia n'udo.


unu gāsi kwa, Otú a ka eze siri, Tiyenu onye a n'ulo-nkpọrọ, me ka o rie nri nmeb͕u, ṅu kwa miri nmeb͕u, rue mb͕e m'gālaghachi n'udo.


N'ihi na eriwom ntu dika nri, Were kwa ikwa-ákwá gwakọta ihe-ọṅuṅum.


Ọ buru unu ihe-efu, unu ndi nēbili n'isi-ututu, ndi nāla azu n'inọdu ala, Ndi nēri nri nke ihe-nb͕u di iche iche: Otú a ka Ọ nēnye ndi Ọ huru n'anya ura.


N'ihi na nání otù ntabi-anya nāgabiga n'iwe-Ya; Ogologo ndu nile nāgabiga na mb͕e ihe-ayi nātọ Yautọ: N'anyasi ikwa-ákwá gābia inọ ọnọdu-abali, Ma n'ututu iti-nkpu-ọṅù gādi.


Ayi ahughi ihe-iriba-ama nile ayi: Ọ dighi onye-amuma di ọzọ; Ọ dighi kwa onye nọ n'etiti ayi nke mara mb͕e mb͕e gēru.


I mewo ka ha rie nri nke bu anya-miri, I mewo kwa ka ha ṅua anya-miri nke juru ihe-ọtùtù uku.


Ònye ka ọ gēzí ihe-ọmuma? ọ̀ bu kwa onye ka ọ gēme ka ọ ghọta ihe anuru? ọ̀ bu ndi emeworo ka ha rapu iṅu miri-ara, ndi anapuru ara?


onye ahu gēbi n'ebe di elu: ebe ewusiri ike nke nkume di elu ka ulo-elu-ya gābu: anēnye ya nri-ya; miri-ya kwesiri ntukwasi-obi.


Onye-nkpọrọ nke nēruda eruda emewo ngwa ka atọpu ya; ọ gaghi anwu kwa we rida n'olùlù, nri-ya agaghi-akọ kwa ukọ.


Ya mere, nāriọnu Onye-nwe owuwe-ihe-ubi ahu, ka O zipu ndi-ọlu bà n'owuwe-ihe-ubi-Ya.


nēme ka nkpuru-obi ndi nēso uzọ Jisus guzosie ike, nāriọ ha ka ha nọgide n'okwukwe-ayi, nēgosi kwa na ayi aghaghi isite n'ọtutu nkpab͕u ba n'ala-eze Chineke.


Ya onwe-ya nye-kwa-ra ufọdu ka ha buru ndi-ozi; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi-amuma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nēzisa ozi ọma; nye kwa ufọdu ka ha buru ndi nāzù aturu Chineke na ndi-ozizí;


Erila achicha koro eko tiyere ya; ubọchi asa ka i gēri achicha ekoghi-eko tiyere ya, bú achicha nweda-n'ala; n'ihi na i mere ngwa ngwa si n'ala Ijipt puta: ka i we nēcheta ubọchi ahu mb͕e i siri n'ala Ijipt puta ubọchi nile nke ndu-gi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan