Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 30:2 - Bible Nso

2 ndi nēje irida n'Ijipt, ma ha ajughi ase n'ọnum; ib͕alaga ọsọsọ n'ebe siri ike nke Fero, na ib͕abà na ǹdò Ijipt!

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka ma ha ajụtaghị ase site nʼaka m. Ndị were obi ha tụkwasị na Fero maka nchebe, chọsiekwa ike ime Ijipt ebe mgbaba.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 30:2
26 Iomraidhean Croise  

Jehoshafat we si, Ọ̀ dighi onye-amuma Jehova nọ n'ebe a tiyere ndia, ka ayi we jua ase n'aka-ya?


Eze Asiria we hu nkekọta-madu imegide ya n'aru Hoshea; n'ihi na o zigara So, bú eze Ijipt, ndi-ozi, ma o bugoghi onyinye-inata-iru-ọma inye eze Asiria, dika ọ nēme kwa-arọ: eze Asiria we mechibido ya, ke ya ab͕u n'ulo-nkpọrọ.


Ub͕u a, le, i tukwasiworo onwe-gi obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ.


Dua ọdu, menu ihe ekpere n'ikpe; me ka ǹdò-gi di ka abali n'etiti oké ehihie: zobe ndi achupuru achupu; ekpughela onye nāwaghari.


Ahuhu gādiri ala ùzù nke ọtutu nkù, nke di n'ofè osimiri nile nke Etiopia:


Le, i tukwasiwo obi n'aru nkpa-n'aka amì a piara apia, bú n'aru Ijipt, nke nwoke nādabere na ya, o we ba n'ọbu-aka-ya, dua ya: otú a ka Fero, bú eze Ijipt, di n'ebe ndi nile nātukwasi ya obi nọ.


Ì gēsi kwa aṅa chighari iru otù onye-ọchi-agha nke ndi-orù onye-nwem ndi kachasi ntà, tukwasiri onwe-gi obi n'aru Ijipt inwe ub͕ọ-ala na ndi-inyinya?


Ma mb͕e ha gāsi unu, Juanu ndi nāju mọ ihe ase, ju-kwa-nu ndi-dibia-afa, ndi nēbe ka umu-nnunu, nātamu kwa ntamu: ǹdi ọ bula agaghi-aju Chineke-ya ase? ọ̀ bu n'ihi ndi di ndu ka agāju ndi nwuru anwu ase?


Ma ub͕u a gini ka i nwere n'uzọ Ijipt, n'iṅu miri Shaihoa? ma-ọbu gini ka i nwere n'uzọ Asiria, n'iṅu miri nke Osimiri ahu?


Biko, juara ayi Jehova ase; n'ihi na Nebukadreza, bú eze Babilon, ebusowo ayi agha: eleghi anya Jehova gēmeso ayi dika oké ọlu-Ya nile si di, we me ka o si n'aru ayi rigo la.


Ọzọ, usu-ndi-agha Fero esiwo n'Ijipt puta: ndi Kaldea ndi nānọchigide Jerusalem n'agha we nuru akukọ-ha, ha we si n'imegide Jerusalem rigo.


si, É-è; kama ọ bu n'ala Ijipt ka ayi gābà, ebe ayi nāgaghi-ahu agha, ayi agaghi-anu kwa olu opì-ike, agu ihe-oriri agaghi-agu kwa ayi; ọ bu kwa n'ebe ahu ka ayi gēbi:


si Jeremaia, bú onye-amuma, Biko, ka aririọ-amara-ayi da n'iru gi, gi kpere ayi Jehova, bú Chineke-gi, ekpere, kpe ekpere bayere ndia nile fọduru; n'ihi na ayi fọduru nànì madu ole-na-ole si n'ọtutu madu puta, dika anya-gi abua si ahu ayi:


N'ihi na unu akpafuwo megide nkpuru-obi-unu; n'ihi na unu onwe-unu zigaram jekuru Jehova, bú Chineke-unu, si, Kpere ayi Jehova, bú Chineke-ayi, ekpere; ọzọ, dika ihe nile si di nke Jehova, bú Chineke-ayi, gāsi, gi gosi ayi otú a, ayi gēme kwa ya:


ha we ba n'ala Ijipt; n'ihi na ha egeghi nti olu Jehova: ha we biarue Tahpanhes.


Ume nke oghere-imi-ayi, bú onye Jehova etere manu, ka ejidere n'olùlù-ha; Onye ayi siri, N'okpuru ǹdò-ya ka ayi gādi ndu n'etiti mba nile.


Ahuhu diri ha! n'ihi na ha awafunariwom; nbibi diri ha! n'ihi na ha ejehiewo megidem: ọ bu ezie na Mu onwem nāb͕aputa ha, ma ha onwe-ha ekwuwo okwu-ugha di iche iche megidem.


E, mb͕e ha gēgo ha n'etiti mba nile, ub͕u a ka M'gāchikọta ha; ọ gēwuta kwa ha nwa mb͕e ntà site n'ibu eze ndi-isi gēbo ha.


N'ihi na ha onwe-ha arigowo n'Asiria, dika inyinya-ibu-ọhia nke nání ya nọ iche: Efraim egowo ndi nāhu ya nānya.


Ọ bu kwa n'iru Eleeza, bú onye-nchu-àjà, ka ọ gēguzo, onye gājuru ya ase n'ikpé Ìhe ahu n'iru Jehova: n'okwu-ọnu-ya ka ha ganāpu apu, ọ bu kwa n'okwu-ọnu-ya ka ha ganābà-abà, ya onwe-ya, na umu Israel nile tiyere ya, bú nzukọm nile.


Jehova gēme kwa ka i were ub͕ọ laghachi n'Ijipt, n'uzọ nke m'siri gi, I gaghi-ahu kwa ya ọzọ ma-ọli: unu gēwere kwa onwe-unu renye ndi-iro-unu n'ebe ahu ibu orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, ma onye-ọb͕ub͕a agaghi-adi.


Ndikom ahu we nara ufọdu nime ihe-oriri-uzọ-ha, ha ajughi kwa ase n'ọnu Jehova.


Ogwu we si osisi nile, Ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu ka unu onwe-unu nētem manu iburu unu eze, bianu, b͕abànu n'okpuru ndo nkem: ma ọ buru na ọ bughi n'ezi-okwu, ka ọku si n'ogwu puta, ripia osisi cedar nile nke Lebanon.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan