Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 30:14 - Bible Nso

14 Ọ gētiwa kwa ya dika esi etiwa ite ndi-ọkpu-ite nākpu, nke etipiara etipia, Ọ gaghi-enwe ọmiko: ewe ghara ichọta n'etiti ntipia-ya otù ejùjù iji guru ọku n'okpukpo-ntu, ma-ọbu iji kupu miri n'ọdọ-miri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ọ ga-etipịasị dịka ite aja, nke etipịara na-enweghị obi ebere, nke a na-enweghị ike ịchọta mpekele ejuju ọbụla nʼetiti ya, iji gụta ọkụ site na-ekwu, maọbụ kupụta mmiri site nʼite.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 30:14
25 Iomraidhean Croise  

Chinke gātu kwa ya ihe, ghara kwa inwe ọmiko n'aru-ya: N'aka-Ya ka o gēsi b͕alaga ab͕alaga.


I gēji nkpa-n'aka ígwè tijisi ha; Dika ihe ọkpu-ite kpuru ka agātupia ha.


Echezọwo mu onwem dika onye nwuru anwu puru n'obi madu: Aghọwom ihe nāla n'iyì.


N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede; N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.


Mb͕e ngalaba-ya kpọnwuru akpọnwu, agānyajipu ha; ndinyom abia sure ha ọku: n'ihi na ọ bughi ndi nwere nghọta ka ọ bu; n'ihi nka Onye meworo ya agaghi-enwe obi-ebere n'aru ya, Onye kpuworo ya agaghi-emere ya amara.


Ọzọ, ìhè ọnwa gādi ka ìhè anyanwu, ìhè anyanwu gādi kwa okpukpu asa, dika ìhè ubọchi asa, n'ubọchi Jehova gēkechi nkpaji akpajiri ndi-Ya, mb͕e Ọ gāgwọ kwa ọnyá etiputara n'otiti-ya.


Le, ha di ka ahihia-ọka kpọrọ nku; ọku erewo ha; ha agaghi-anaputa onwe-ha n'aka ire ọku: ọ bughi icheku-ọku nēre ere iji nya ọku, ọ bughi kwa ọku inọdu n'iru ya.


ajọ omume nile nke unu na ajọ omume nile nke ndi bu nna-unu n'otù, ka Jehova siri, bú ndi sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ugwu nile, takwam uta n'elu ugwu ntà nile: M'gēbu kwa uzọ tùa ọlu-ha n'obi-ha.


M'gātupia kwa ha, otù onye n'elu ibe-ya, ọbuná ndi bu nna na umu-ha n'otù; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta: M'gaghi-enwe ọmiko, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa obi-ebere, ka M'we ghara ibibi ha.


N'elu-ulo nile nke Moab na n'amá-ya nile, n'ebe nile ọ bula, ka iti-aka-n'obi di: n'ihi na etiwawom Moab dika ihe nātọghi utọ; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Umu Zaion nke di oké ọnu-ahia, ndi eji turu ọla-edo anuchara anucha, Le otú aguworo ha n'ite urọ, bú ọlu aka ọkpu-ite!


Mu onwem, bú Jehova, ekwuwo okwu: ọ gābia, M'gēme kwa ya; M'gaghi-arapu, M'gaghi-eme kwa ebere, M'gaghi-echèghari; dika uzọ-gi nile si di, na dika omume-gi nile si di, otú a ka ha gēkpe gi ikpe; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


N'ihi nka, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), n'ihi na ebe nsọm ka i meruworo n'ihe-gi nile nke jọb͕uru onwe-ha, na n'ihe-árú-gi nile, n'ihi ya Mu onwem aghaghi kwa ibilata gi; anyam agaghi-eme kwa ebere; ọzọ kwa, Mu onwem agaghi-enwe ọmiko.


Anyam agaghi-eme-kwa-ra gi ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: kama uzọ nile gi ka M'gētiyekwasi gi, ihe-árú-gi nile gādi kwa n'etiti gi: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Anyam agaghi-enwe kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: dika uzọ-gi nile si di ka M'gētiyekwasi gi ihe, ihe-árú-gi nile gādi kwa n'etiti gi; unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, nētib͕u.


Ma Mu onwem gēmeso kwa ha n'ọnuma: anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: ọ buru kwa na ha akpọ nkpu na ntim abua n'oké olu, ma M'gaghi-anu olu-ha.


Ma Mu onwem kwa, anyam agaghi-enwe ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko, uzọ-ha ka M'gētiyekwasi n'isi-ha.


ekwensu nānwà kwa Ya ọgu ubọchi abua. O righi kwa ihe ọ bula n'ubọchi ahu: mb͕e ubọchi ahu zuru, agu we gua Ya.


n'ihi na asi na Chineke emeghi alaka ahu osisi olive ji puta uwa ebere, Ọ gaghi-eme kwa gi ebere.


Onye ahu Nke nāzọdoghi Ọkpara nke aka Ya, kama Ọ rara Ya nye n'ihi ayi nile, Ò gēsi aṅa ghara inye kwa ayi ihe nile n'amara ebe O weresiri Onye ahu nye ayi?


Jehova agaghi-ekwe ib͕aghara ya, kama mb͕e ahu iwe Jehova na ekworo-Ya gākwu anwuru-ọku imegide nwoke ahu, ọb͕ub͕a-iyi nile edeworo n'akwukwọ a gāmakpu kwa n'aru ya, Jehova gēhichapu kwa aha-ya n'okpuru elu-igwe.


ọ gewere kwa nkpa-n'aka ígwè zùa ha dika aturu, dika anākujisi ite nke ọkpu-ite; dika Mu onwem natawokwara n'aka Nnam:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan