Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 30:13 - Bible Nso

13 n'ihi nka ajọ omume a gādiri unu ka nb͕awa nāda ada, nke nākwọputa akwọputa na mb͕idi di elu, nke ọ bu na mberede n'otù ntabi-anya ka ntipia-ya nābia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 mmehie a ga-aghọrọ unu ihe dịka mgbidi dị elu, nke gbawara agbawa, nke ga-ada na mberede, nʼotu ntabi anya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 30:13
19 Iomraidhean Croise  

Ndi fọduru we b͕alaga n'Efek, rue obodo; mb͕idi obodo we dakwasi orú nnù ndikom atọ na nnù asa na ọgu iri fọduru. Ma Ben-hedad b͕alagara, ba n'obodo, n'ime-ulo nke di n'ime-ulo.


N'ihi na lezie anya ka ọnuma ghara irafu gi site n'otiti-ihe; Ekwe-kwa-la ka iba-uba nke ihe-nb͕aputa wezuga gi.


Rùe ole mb͕e ka unu ganāwagide madu? Unu nētipia ya, unu nile, Dika mb͕idi ruru eruru, dika ogige nke anēnuda enuda.


Ọ bu nání isi na nbuli-elu-ya nupu ya ka ha b͕aworo ìzù; Okwu-ugha nātọ ha utọ: Ha nēji ọnu-ha agọzi, ma n'ime obi-ha ha nākọcha akọcha. Selah


Onye anābara nba ọtutu mb͕e ma ọ nēkwesi olu-ya ike, N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.


N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede; N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha we kpughepu Onwe-ya na ntim abua, si, N'ezie agaghi-ekpuchiri unu ajọ omume a rue mb͕e unu gānwu, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri.


N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n'uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.


Ma ìgwè ndi ala ọzọ nēmegide gi gādi ka ájá di ntà, ìgwè ndi nēme ka madu ma jijiji gādi kwa ka ib͕ob͕o-ọka nke nāgabiga agabiga: ọ gādi kwa n'otù ntabi-anya na mberede.


Ọzọ, ìhè ọnwa gādi ka ìhè anyanwu, ìhè anyanwu gādi kwa okpukpu asa, dika ìhè ubọchi asa, n'ubọchi Jehova gēkechi nkpaji akpajiri ndi-Ya, mb͕e Ọ gāgwọ kwa ọnyá etiputara n'otiti-ya.


Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.


Ihe mbu nile site na mb͕e ochie ka M'gosiworo; ọ bu kwa n'ọnum ka ha siri puta, M'we meka anu ha: na mberede ka M'mere ha, ha we me.


Ndi gēsi n'aru-gi puta gēwu kwa ebe nile bu nkpọnkpọ ebe site na mb͕e ebighi-ebi gara aga: ntọ-ala nke ọtutu ọb͕ọ ka i gēwuli; agākpọ kwa gi Onye-nmechi ntipú, Onye-nkwazi okporo-uzọ ibi ebi.


ajọ omume nile nke unu na ajọ omume nile nke ndi bu nna-unu n'otù, ka Jehova siri, bú ndi sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ugwu nile, takwam uta n'elu ugwu ntà nile: M'gēbu kwa uzọ tùa ọlu-ha n'obi-ha.


miri we zo, osimiri ru kwa, ifufe fe kwa, we tikwasi ulo ahu; o we da: ọdida-ya di kwa uku.


Ma onye nānu, ma o meghi ha, yiri madu nke nēwu ulo n'elu ala nēnweghi ntọ-ala; nke osimiri tikwasiri, ngwa ngwa o we dakasi; nbibi nke ulo ahu di kwa uku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan