Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 29:8 - Bible Nso

8 Ọ gādi kwa ka mb͕e onye agu nāgu nārọ nrọ, ma, le, ọ nēri ihe; o we teta, ma nkpuru-obi-ya b͕ara aka: ma-ọbu dika mb͕e onye akpiri nākpọ nku nārọ nrọ, ma, le, ọ nāṅu miri; ọ we teta, ma, le, ọ dawo #mbà, nkpuru-obi-ya nāchọsi kwa ihe ike: otú a ka ìgwè mba nile gādi, ndi nēbuso ugwu Zaion agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri, ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta. Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ, ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba. E, otu a ka ọ ga-adị mgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 29:8
10 Iomraidhean Croise  

Jehova we ziga mọ-ozi, o we kpochapu ndi-dike nile bu dìnkpà, na ndi-ndú na ndi-isi, n'ọmuma-ulo-ikwū nke eze Asiria. O we were ihere iru laghachi n'ala-ya. O we ba n'ulo chi-ya, ndi siri na ngiri-afọ-ya we were mma-agha me ka ọ da nwua n'ebe ahu.


Ka ihere me ha, ka ha laghachi kwa azu, Bú ndi nile nākpọ Zaion asì.


Dika nrọ mb͕e madu nēteta n'ura; Otú a, Onye-nwe-ayi, mb͕e I gākpọte Onwe-gi, I gēleda onyinyo-ha anya.


Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n'aru gi, agētiye ha n'ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n'iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù.


I gāchọ ha, ma i gaghi-achọta ha, bú ndi gi na ha nēse okwu: ha gādi ka ihe nābughi ihe na dika ihe-efu, bú ndi nēbuso gi agha.


Uzú nākpu ihe-ọlu, o were icheku alu, were kwa otùtù-ya nile akpu ya, were kwa ogwe-aka-ya di ike alu ya: ọzọ, agu nāgu ya, ike we ghara idi; ọ ṅughi miri, o we da #mbà.


Ọ dighi ihe-agha ọ bula akpuworo imegide gi gāga nke-ọma: ọzọ, ire ọ bula nke gēbili imegide gi n'ikpé ka i gāma ikpe. Nka bu ihe-nketa nke ndi-orù Jehova, ezi omume-ha nēsite nam: ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Le, n'elu ugwu ka ukwu nke onye n'ezisa ozi ọma di, bú onye nēme ka anuru okwu udo! Me ememe-gi nile, gi Juda, Kwughachi nkwa nile i kwere: n'ihi na onye jọb͕uru onwe-ya agaghi-agabiga kwa nime gi ọzọ; ebipusiwo ya.


Onye-nchusa arigotawo n'iru-gi: chebe ebe ewusiri ike, che uzọ nche, me ka úkwù-gi sie ike, b͕a ike ume nke-uku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan