Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 29:5 - Bible Nso

5 Ma ìgwè ndi ala ọzọ nēmegide gi gādi ka ájá di ntà, ìgwè ndi nēme ka madu ma jijiji gādi kwa ka ib͕ob͕o-ọka nke nāgabiga agabiga: ọ gādi kwa n'otù ntabi-anya na mberede.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ma igwe ndị iro gị ga-aghọ ntụ, igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu. Mgbe ahụ, na mberede,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 29:5
24 Iomraidhean Croise  

Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe, Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?


Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di; Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa.


Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.


M'gēwere kwa ihe ọjọ ya leta elu-uwa dum madu bi, were kwa ajọ omume-ha leta ndi nēmebi iwu; M'gēme kwa ka npako nke ndi-nganga kwusi, M'gēme kwa idi-elu nke ndi nēme ka madu ma jijiji ka ọ di ala.


N'ihi nka ka ndi di ike gāsọpuru Gi, obodo nke ndi-mba ndi nēme ka madu ma jijiji gātu egwu Gi.


N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.


Dika okpom-ọku n'ebe kpọrọ nku, otú a ka I gēme ka nkpọtu nke ndi ala ọzọ darue ala; dika okpom-ọku site na ǹdò nke igwe-oji, otú a ka agēweda abú ọma nke ndi nēme ka madu ma jijiji.


N'ihi na onye nēme ka madu ma jijiji nwere ọgwugwu, onye nākwa emò agwusiwo kwa, ebipuwo kwa ndi nile nāmuru ajọ ihe anya:


n'ihi nka ajọ omume a gādiri unu ka nb͕awa nāda ada, nke nākwọputa akwọputa na mb͕idi di elu, nke ọ bu na mberede n'otù ntabi-anya ka ntipia-ya nābia.


Ma ndi Ijipt bu madu, ha abughi Chineke; inyinya-ha bu kwa anu-aru, ha abughi mọ: Jehova gēseti kwa aka-Ya, onye nēye aka ewe su ngọngọ, onye anēyere aka adà kwa, ọ bu kwa n'otù ka ha nile gāgwusi.


Asiria gāda kwa site na mma-agha nke nābughi nke madu di elu: mma-agha nke nābughi nke madu di ala gērichapu kwa ya: ọ gēsi kwa n'iru mma-agha b͕alaga, umu-okorọbia-ya gāghọ kwa usu ndi nēfè òfùfè.


Mọ-ozi nke Jehova we pua, tib͕ue n'ọmuma-ulo-ikwū Asiria orú nnù ndikom orú uzọ na uzọ atọ, na nnù ndikom abua na ọgu iri: madu we bilie n'isi-ututu, ma, le, ha nile bu ozu nwuru anwu.


Le, aguwo mba nile n'otù ntu-miri nātupu n'ite-miri, na n'uzuzu nke ihe-ọtùtù: le, Ọ nāchili agwe-etiti dika ifurifu-ihe.


Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n'aru gi, agētiye ha n'ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n'iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù.


Le, emewom ka i ghọ ihe-nkpọre eji azọcha ọka, bú ihe di nkọ di ọhu nwere ezé: i gāzọcha ugwu, zọpia ha, i gēme kwa ugwu ntà ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka.


I gāfucha ha, ifufe gēfepu kwa ha, oké ifufe gēfesa kwa ha: ma gi onwe-gi gēteghari egwú ọṅù na Jehova, n'Onye Nsọ nke Israel ka i gānya isi.


Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.


Ihe mbu nile site na mb͕e ochie ka M'gosiworo; ọ bu kwa n'ọnum ka ha siri puta, M'we meka anu ha: na mberede ka M'mere ha, ha we me.


Onye ahu Nke nēme ka nbibi b͕ukwasi onye di ike dika àmùmà, nbibi ewe biakwasi ebe ewusiri ike.


Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan