Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 29:24 - Bible Nso

24 Ndi nākpafu na mọ-ha gāma kwa nghọta, ndi-ntamu gāmuta kwa ihe-nmuta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta, ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 29:24
19 Iomraidhean Croise  

Ma ọbuná ndia adaghariwo site na manya-vine, ọ bu kwa site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ka ha ṅaghariworo; onye-nchu-àjà na onye-amuma adaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, manya-vine elodawo ha, ha aṅaghariwo site n'ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ha adaghariwo n'ọhuhu, ha asuwo ngọngọ n'ihe nile ekpere n'ikpe.


nti-gi abua gānu kwa okwu n'azu-gi, si, Nka bu uzọ, jenu ije nime ya; mb͕e unu nēche iru n'aka-nri, na mb͕e unu nēche iru n'aka-ekpe.


Obi nke ndi nēme ngwa ngwa gāghọta kwa ihe-ọmuma, ire nke ndi-nsu gēkwuwa kwa okwu ngwa ngwa.


ka ha we hu, mara, tukwasi obi, nwe uche ighọta n'otù, na aka Jehova mere nka, na Onye Nsọ nke Israel kère ya.


Ọzọ, umu-gi nile gābu ndi-nmuta Jehova; udo nke umu-gi gāba kwa uba.


I gāṅu kwa miri-ara nke mba di iche iche, ọ bu kwa ara ndi-eze ka i gāmi: i we mara na Mu onwem, Jehova, bu Onye-nzọputa-gi na Onye-nb͕aputa-gi, bú Onye di ike nke Jekob.


ha agaghi-eme kwa onwe-ha ka ha muta ọzọ, onye ọ bula o me ka onye-ab͕ata-obi-ya muta, onye ọ bula o me kwa ka nwa-nne-ya muta, si, Maranu Jehova: n'ihi na ha nile gāmara Mu onwem, site n'onye dikarisiri ntà nime ha we rue onye dikarisiri uku nime ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): n'ihi na M'gāb͕aghara ajọ omume-ha, M'gaghi-echeta kwa nmehie-ha ọzọ.


M'gāwukwasi kwa n'ulo Devid na n'aru onye bi na Jerusalem, mọ nke amara na aririọ-amara nile; ha gēlegidekwam anya, bú Onye ha mapūworo amapú: ha gēti-kwa-ra ya aka n'obi, dika madu si eti-kwa-ra nwa-nwoke amuru nání ya aka n'obi, obi-ha gēlu kwa ilu bayere ya, dika onye obi-ya nēlu ilu bayere nwa o buru uzọ mu.


N'ihi nka asim i, Ab͕agharaworo ya nmehie-ya, nke di ọtutu; n'ihi na ọ hurum n'anya nke-uku: ma onye ab͕aghara ihe ntà, onye ahu nāhu n'anya nke-ntà.


Ma mb͕e ha nuru nke a, ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi-ozi fọduru, Umu-nna-ayi, gini ka ayi gēme?


Okwu Chineke we nāga n'iru; ọnu-ọgugu nke ndi nēso uzọ Jisus nāba kwa uba na Jerusalem ri nne; oké ìgwè ndi-nchu-àjà nāṅa kwa okwukwe ahu nti.


Otú a ka ufọdu n'etiti unu di-kwa-ri: ma unu sachara onwe-unu, ma edoro unu nsọ, ma aguru unu na ndi ezi omume n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist, ya na nime Mọ nke Chineke-ayi.


ọ bu kwa onye puru iwere nwayọ nēmeso ndi nāmaghi ihe ndi nējehie kwa ejehie, n'ihi na adighi-ike di kwa ya onwe-ya gburugburu;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan