Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 28:28 - Bible Nso

28 Ànāsupia ọka eji eme achicha? é-è, n'ihi na ọ bughi rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ ganāzọchasi ya ike, me ka wheel nke ub͕ọ-ala-ya na inyinya-ya nile gagharia n'elu-ya; ọ dighi-asupia ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ, ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a na-anọgide na-etichapụta ya. E nwere ike jiri ụkwụ igwe ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ zọchaa ha, ma ọ bụghị ka a kwọpịasịa mkpụrụ ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 28:28
12 Iomraidhean Croise  

Gi ihe-nzọcham, na nwa nke ebe-nzọcha-ọkam: ihe m'nuworo n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, ka m'gosiworo unu.


N'ihi na ejighi ihe di nkọ zọcha fitch, adigh-akpore kwa wheel nke ub͕ọ-ala buruburu n'elu cummin; kama ọ bu nkpa-n'aka ka eji ticha fitch, ọ bu kwa ndele ka eji ticha cummin.


Nka site-kwa-ra n'aka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, O mewo ka ndum-ọdu di ebube, O mewo ka nzube-ihe di uku.


Dọm aka na nti, Jehova, ma nání n'ikpé; adọlam aka na nti n'iwe-gi, ka I we ghara ibilatam.


N'ihi na, le, Mu onwem gaje inye iwu, yọchaghari ulo Israel iru na azu n'etiti mba nile, dika esi ayọchaghari ọka nime nyọ, ma ọ dighi otù nkpuru-ọka gāda n'ala.


ha we weta onyinye-ha iji biaru nso n'iru Jehova, ugbala isi nwere ihe-okpukpu, na ehi iri na abua; otù ugbala diri ndi-isi abua, otù ehi di-kwa-ra otù onye: ha we weta ha nso n'iru ebe-obibi ahu.


Onye ihe-ifucha-ọka-Ya di n'aka-Ya, Ọ gāfuchapu kwa ebe-nzọcha-ọka-Ya nke-ọma, Ọ gēkpokọta kwa ọka-Ya n'ọba-Ya, ma Ọ gēji ọku anāpughi imenyu emenyu rechapu ib͕ob͕o.


N'ezie, n'ezie, asim unu, Ọ buru na nkpuru ọka adaghi n'ala we nwua, nání ya onwe-ya nānọgide; ma ọ buru na ọ nwuru, ọ mia ọtutu nkpuru.


N'ihi na ayi bu ndi ha na Chineke nālukọ ọlu: unu bu ubi Chineke, buru kwa ulo Chineke nēwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan