Ma ub͕u a, unu aghọla ndi nākwa emò, ka ab͕u-unu we ghara isi ike: n'ihi na ngwusi, nke aka-kwa-ra àkà, ka m'nuworo n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'elu uwa nile.
Ma enwerem ihe ole-na-ole imegide gi, n'ihi na i nwere n'ebe ahu ufọdu ndi nējidesi ozizí Belam ike, bú onye nēzí Belak itọb͕ọ n'iru umu Israel ihe-ima-n'ọnyà, ka ha rie ihe achuru n'àjà nye arusi, ka ha kwa kwa iko.
Onye nwere nti, ya nu ihe Mọ Nsọ nāgwa nzukọ Kraist. Onye nēmeri emeri, ya ka M'gēkweye ka o rie nkpuru si n'osisi nke ndu ahu puta, bú nke di na Paradais nke Chineke.