Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 28:19 - Bible Nso

19 Mb͕e ọ bula ọ nāgabiga ọ gējide unu; n'ihi na kwa-ututu ka ọ gāgabiga, n'ehihie na n'abali: o we buru nání ọma-jijiji ighọta ihe anuru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

19 Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu, maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị, oge niile, mgbe mgbe.” Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke; ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 28:19
26 Iomraidhean Croise  

N'arọ nke-iteghete nke Hoshea ka eze Asiria were Sameria, me ka Israel je biri n'Asiria, me ka ha biri nime Hala, na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia.


Ma n'arọ nke-iri-na-anọ nke eze, bú Hezekaia, Senakerib, bú eze Asiria, rigoro imegide obodo nile ewusiri ike nke Juda, were ha.


n'ihi ya otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Le, M'nēme ka ihe ọjọ biakwasi Jerusalem na Juda, nke nti abua nke onye ọ bula nānu gāzu wuruwuru.


Jehova we zìe usu ndi nāpunara madu ihe nke ndi Kaldea, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Siria, na usu ndi nāpunara madu ihe nke Moab, na usu ndi nāpunara madu ihe nke umu Amon, imegide ya, o zì-kwa-ra ha imegide Juda ime ka ọ la n'iyì, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru site n'aka ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma.


Ihe-egwu emewo ka ọ tua egwu nke-uku buruburu, Ha we chugharia ya n'ukwu-ya.


N'ihi na ututu buru usu ha nile onyinyo ọnwu; N'ihi na ọ nāmata ihe-egwu nile nke onyinyo ọnwu.


Le, nchere-ya bu ihe-ugha: Àdighi-atuda madu ọbuná n'ile ya anya?


N'ihi na àkú nile nke Onye puru ime ihe nile di nimem, Nke ńsí-ha ka mọm nāṅu Ihe-egwu Chineke nēdo onwe-ha n'usoro imegidem.


O nēb͕usi nkpuru-obim nb͕u ike nimem: Oké ujọ nile nke ọnwu adakwasiwo-kwam.


Onye ewedara n'ala na onye nēkubi ume ka m'bu site na nwata: Eburuwom oké ujọ Gi nile, obim nālọ miri.


Le, dìnkpà-ha nile nēti nkpu n'èzì: ndi-ozi udo nākwakpọ anya.


Elaiakim nwa Hilkaia, nke bu onye-isi ulo, na Shebna, bú ode-akwukwọ na Joa nwa Esaf, bú onye-ncheta, we biakute Hezekaia, ha na uwe-ha dọwara adọwa, ha we gosi ya okwu nile nke Rabshake.


Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n'ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha.


Onye-nwe-ayi, bú Jehova, enyewom ire nke ndi-nmuta, ka m'we mara iwere okwu kwagide onye dara #mbà: Ọ nākpọte ntim kwa-ututu, Ọ nākpọte ntim inu ihe dika ndi-nmuta.


si, Nurunu okwu Jehova, unu ndi-eze Juda, na ndi bi na Jerusalem; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri, Le, M'gaje ime ka ihe ọjọ biakwasi ebe a, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.


Gosinu na Juda, me-kwa-nu ka anuru ya na Jerusalem; si-kwa-nu, Fùanu opì-ike n'ala nka: kpọzuenu nkpu, si, Chikọtanu onwe-unu, ka ayi ba kwa n'obodo nile ewusiri ike.


O gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na obi eze gāla n'iyì, ya na obi ndi-isi; ibobo gānwu kwa ndi-nchu-aja n'aru, ọ gāb͕agwoju kwa ndi-amuma anya.


Ayi anuwo ùdé-ya; aka-ayi akudawo: ihe-nb͕u ejidewo ayi, ihe-nb͕ali dika nke nwayi ime nēme.


I nākpọ, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà, ujọm nile di buruburu, Ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu n'ubọchi nke iwe Jehova: Umum ndi m'tughariworo n'aka zulite, onye-irom emewo ka ha gwusia.


N'ebe a ka ọgwugwu okwu a di. Ma mu onwem, bú Daniel, èchìchèm nile nēme ka m'ma jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke irum nāb͕anwe kwa n'arum: ma okwu ahu ka m'debere n'obim.


Ma mu onwem, bú Daniel, ike gwurum, m'we ria ọria ubọchi ufọdu; m'we bilie, je ozi eze: ọhù ahu ju-kwa-ram anya, ma ọ dighi onye nāghọta ya.


Anurum, afọm we ma jijiji, N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta; Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji: Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu, Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe.


Jehova we si Samuel, Le, Mu onwem nēme ihe n'Israel, nke nti abua nke onye ọ bula nānu ya gāzu wuruwuru.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan