Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 28:18 - Bible Nso

18 Agēhichapu kwa ọb͕ub͕a-ndu unu na ọnwu b͕ara, nkwa unu na ala-mọ kweritara agaghi-eguzosi kwa ike; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, unu gāghọ-kwa-ra ya ebe-nzọda.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara; mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa. Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-azọda unu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 28:18
22 Iomraidhean Croise  

ọ gādakwasi kwa ulo-elu ọ bula di elu, ọ gādakwasi kwa mb͕idi ọ bula ewusiri ike;


N'ihi na unu asiwo, Ayi na ọnwu ab͕awo ndu, ayi na ala-mọ ekweritawo kwa nkwa; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, ọ gaghi-abiakute ayi; n'ihi na ayi emewo ka okwu-ugha buru ebe-nb͕abà-ayi, ọ bu kwa n'okwu-ugha ka ayi zobeworo onwe-ayi:


N'okpuru ukwu ka agāzọda okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè:


Ma ub͕u a, biko, ka m'me ka unu mara ihe mu onwem gaje ime ubi-vine nkem: m'gēwezuga ogige-ya, o we ghọ ebe anu-ulo nāta nri; m'gētipia mb͕idi-ya, o we ghọ ebe anāzọtọ:


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri, Ọ gaghi-eguzosi ike, ọ gaghi-adi kwa.


Duritanu onwe-unu ọdu, ma agēmebi ya; kwuenu okwu, ma ọ gaghi-eguzosi ike: n'ihi na Chineke nọyere ayi.


ọ gēruru kwa ba na Juda; ọ gēruchi, gabiga kwa; ọbuná n'olu ka ọ gēru; nsetipu nkù-ya abua gābu kwa ihe juputara obosara ala-gi, Immanuel.


M'gāwusi kwa ndum-ọdu Juda na Jerusalem n'ebe a dika miri; M'gēme kwa ka ha da site na mma-agha n'iru ndi-iro-ha, na site n'aka ndi nāchọ ndu-ha: M'gēnye kwa ozu-ha iburu anu-ufe nke elu-igwe, na iburu anumanu nke uwa, ihe-oriri.


Ọbuná n'ala nka ka i gēsi pua, aka-gi abua adi kwa n'isi-gi: n'ihi na Jehova ajuwo ihe-ntukwasi-obi-gi nile, ọ gaghi-aga-kwa-ra gi nke-ọma nime ha.


Ma ndi b͕apuworo na mma-agha gēsi n'ala Ijipt laghachi n'ala Juda, ndikom ole-na-ole; ndi Juda nile fọduru, bú ndi biaruworo ala Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu, ewe mara onye okwu-ya gēguzosi ike, nkem, ma-ọbu nke ha.


Otú a ka Jehova siri: Le, miri nēsi n'Ugwu erú, ha gāghọ kwa miri-iyi nērubiga ókè, ha gērusa kwa ala na ùjú-ya, na obodo na ndi bi nime ya: madu ewe tie nkpu, ndi nile bi n'ala ahu gākwasi kwa ákwá ike.


Anya-ayi nādala n'isi rue ub͕u a n'ile anya iye-aka efu ayi: N'iche-nche-ayi ayi echewo nche mba nke nādighi-azọputa.


gi si ndi nēte ya nzu, na ọ gāda: oké miri-ozuzo nke nēzobiga ókè gēzo; unu onwe-unu kwa, oké ákú-miri-ígwé, gāda; oké ifufe gāb͕awa kwa ya.


O we nupu isi n'okpuru ya n'iziga ndi-ozi-ya n'Ijipt ka ha we nye ya inyinya na ndi bara uba. Ọ̀ gāgara ya nke-ọma? ọ̀ gēwepuga onwe-ya, bú onye nēme ihe ndia? ọ̀ gēmebi ọb͕ub͕a-ndu, we wepuga onwe-ya?


Ma na mb͕e nke ọgwugwu ihe ndia eze Ndida gāmalite isọ ya mpi: eze Ugwu ewe dakwasi ya dika oké ifufe, chiri ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya, chiri kwa ọtutu ub͕ọ; ọ gābà kwa n'ala-ya nile, rubiga ókè dika miri, gabiga.


Ma Ọ gēji miri nke nērubiga ókè nke nērubiga erubiga me ka ọnọdu obodo ahu gwusia, ọ bu kwa ndi-iro-Ya ka Ọ gāchubà n'ọchichiri.


Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M'nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n'iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi.


Agwọ ahu we b͕uputa miri n'ọnu-ya n'azu nwanyi ahu dika osimiri, ka o we me ka osimiri ahu bupu ya.


O we sim, Miri nile i huru, ebe nwanyi ahu onye nākwa iko nānọdu, bu ndi di iche iche, na ìgwè madu, na mba di iche iche, na asusu di iche iche.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan