Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 28:14 - Bible Nso

14 N'ihi nka nurunu okwu Jehova, unu ndi nākwa emò, ndi nāchi ndi nka bi na Jerusalem:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-akwa emo, ndị ọchịchị Jerusalem dị nʼaka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 28:14
16 Iomraidhean Croise  

Unu ndi nēnweghi uche, rùe ole mb͕e ka unu gāhu enweghi-uche n'anya? Rùe ole mb͕e ka ndi nākwa emò gāchọsi-kwa-ra onwe-ha ikwa-emò ike? Rùe ole mb͕e ka ndi-nzuzu gākpọ kwa ihe-ọmuma asì?


Ndi nākwa emò nāfuye ọku n'obodo: Ma ndi mara ihe nēme ka iwe laghachi azu.


Ọ buru na ọ bu ndi nākwa emò ka Ya onwe-ya nākwa emò, Ma ọ bu ndi di ume-ala n'obi ka Ọ nēnye amara.


Nurunu okwu Jehova, unu ndi-ikpe Sọdọm; ṅanu nti n'iwu Chineke-ayi, unu ndi Gọmọra.


Ndi-isi-gi nēwezuga onwe-ha n'ebe M'nọ, ha bu kwa ndi ejikọtara ha na ndi-ori; onye ọ bula nime ha nāhu iri-ngo n'anya, nāb͕aso kwa ihe-nkwughachi: ọ dighi nwa-nb͕ei ha nēkpe ikpe ziri ezi, okwu-ikpe nke nwanyi di-ya nwuru adighi-abiakute kwa ha.


Ma ub͕u a, unu aghọla ndi nākwa emò, ka ab͕u-unu we ghara isi ike: n'ihi na ngwusi, nke aka-kwa-ra àkà, ka m'nuworo n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, n'elu uwa nile.


N'ihi na onye nēme ka madu ma jijiji nwere ọgwugwu, onye nākwa emò agwusiwo kwa, ebipuwo kwa ndi nile nāmuru ajọ ihe anya:


Ndim, ndi nāchi ha n'ihe-ike bu nwatakiri, ndinyom achiwo kwa ha. Gi ndim, ndi-nduzi-gi nēme ka i wagharia, ha elodawo kwa uzọ nke okporo-uzọ-gi nile.


Genum nti, unu ndi di ike n'obi, ndi nọpuru ezi omume n'ebe di anya:


Na ntim abua ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, N'ezie ọtutu ulo gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọbuná ulo uku nke bu kwa ezi ulo, nke ọ nādighi onye ọ bula nēbi nime ha.


Nurunu, ge kwa nti; unu adila elu n'obi: n'ihi na Jehova ekwuwo.


O rue, mb͕e Jehudi gusiri ibe akwukwọ atọ ma-ọbu anọ, na o ji mma ode-akwukwọ bìkasia ya, tubà ya n'ọku nke di n'ite-ọku, rue mb͕e akwukwọ-npiakọta ahu resiri n'ọku nke di n'ite-ọku.


N'ihi nka, gi nwanyi nākwa iko, nuru okwu Jehova:


N'ubọchi eze-ayi ndi-isi jiri idi-ọku nke manya-vine ria ọria; o soro ndi nākwa emò setia aka-ya.


unu ndi nāṅuri n'ihe nābughi ihe, ndi nāsi, Ọ̀ bughi ike nke aka ayi ka ayi jiworo natara onwe-ayi mpi di iche iche?


Lenu, ndi-nlelì-anya, ka o ju kwa unu anya, ka ekpochapu kwa unu; N'ihi na ọlu ka Mu Onwem nālu n'ubọchi-unu, Ọlu unu nāgaghi-ekwe ma-ọli ọ buru na onye ọ bula kọrọ unu akukọ-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan