Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 27:7 - Bible Nso

7 Ọ̀ bu dika ntib͕u nke onye nētib͕u ya-ri ka O tib͕uworo ya? ma ọ̀ bu dika ob͕ub͕u nke ndi o nēb͕uri ka eb͕uworo ya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụ dịka o si taa ndị iro ya. O mebekwaghị ka e gbuo ndị ya dị ka e si gbuo ndị iro ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 27:7
17 Iomraidhean Croise  

Ọ gēru kwa, mb͕e Onye-nwe-unu gālubì ọlu-Ya nile n'ugwu Zaion na nime Jerusalem, na M'gēleta nkpuru nke oké obi eze Asiria, leta kwa ima-nma nke anya npako ya.


Ìhè Israel gāghọ kwa ọku, Onye Nsọ ya gāghọ kwa onwunwu-ọku, we re ọku richapu uke-ya na ogwu-ya n'otù ubọchi.


Na mb͕e anyasi le, oké egwu di: tutu ututu erue ọ dighi. Nka bu òkè nke ndi nāpunara ayi ihe; na ihe ruru ha n'ife-nzà, bú ndi nāluta ihe-ayi n'agha.


Ebe ewusiri ike gāgwupu n'Efraim, ala-eze gāgwupu kwa na Damaskọs, ya na ndi Siria fọduru; dika nsọpuru umu Israel ka ha gādi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.


N'ihi na agēsite n'olu Jehova nyajisia Asiria, Ọ gēji ndele tib͕ue ya.


Asiria gāda kwa site na mma-agha nke nābughi nke madu di elu: mma-agha nke nābughi nke madu di ala gērichapu kwa ya: ọ gēsi kwa n'iru mma-agha b͕alaga, umu-okorọbia-ya gāghọ kwa usu ndi nēfè òfùfè.


Nkume-ya nke di elu gāgabiga site n'ujọ, ndi-isi-ya gātu kwa ujọ ọkọlọtọ, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Onye ìhè O nwere di na Zaion, ite-ọku uku O nwere di kwa na Jerusalem.


Dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra na ab͕ata nile ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); otú a ọ dighi onye ọ bula gēbi n'ebe ahu, nwa madu ọ bula agaghi-anọ kwa dika ọbìa nime ya.


M'gākwughachi kwa Babilon, kwughachi kwa ndi nile bi na Kaldea, ihe ọjọ nile ha nke ha meworo nime Zaion n'anya-unu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Jehova enyewo kwa iwu bayere gi, ka aghara igha kwa nkpuru ọ bula ọzọ nke sitere n'aha-gi: n'ulo chi-gi nile ka M'gēbipu arusi apiri api na arusi awuru awu; M'gēdo ílì-gi; n'ihi na elelìwo gi anya.


Ọ dighi nbilata nb͕aji ab͕ajiri gi nwere; ntiputa-ọnyá-gi jọrọ njọ: ndi nile ndi nānu ihe-ọnunu bayere gi gākukpo gi aka-ha; n'ihi na ònye ka ihe ọjọ gi nāgabigaghi n'isi-ya mb͕e dum?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan