Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 26:21 - Bible Nso

21 N'ihi na, le, Jehova nēsi n'ọnọdu-Ya aputa iji ajọ omume nke ndi bi n'uwa leta ha: ọzọ, ala gēkpughe ọbara-ya, ọ gaghi-ekpuchi kwa ndi-ya eb͕uru eb͕u ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 Lee anya! Onyenwe anyị si nʼebe obibi ya na-abịa ikpe ndị bi nʼụwa ikpe nʼihi mmehie ha niile. Ụwa ga-ekpughepụ gosi ọbara niile a wụsiri nʼelu ya, ọ gaghị ezokwa ndị niile e gburu lie nʼime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 26:21
28 Iomraidhean Croise  

Ala, ekpuchila ọbaram, Ka ọnọdu ghara idiri iti-nkpum.


Elu-igwe gēkpughe ajọ omume-ya, Ala nēbili kwa imegide ya.


Ọ̀ bu kwa gini ka unu gēme n'ubọchi nleta, na n'ila-n'iyì nke gēsi n'ebe di anya bia? Ònye ka unu gāb͕akuru ka o we yere unu aka? ọ̀ bu kwa ole ebe unu gārapu nsọpuru-unu?


M'gēwere kwa ihe ọjọ ya leta elu-uwa dum madu bi, were kwa ajọ omume-ha leta ndi nēmebi iwu; M'gēme kwa ka npako nke ndi-nganga kwusi, M'gēme kwa idi-elu nke ndi nēme ka madu ma jijiji ka ọ di ala.


N'ihi na otú a ka Jehova siworom, M'gānọ jū, M'gēlegíde kwa anya n'ebem guzosiri ike; dika okpom-ọku nēnwu enwu n'ìhè anyanwu, dika alulu igirigi n'okpom-ọku nke owuwe-ihe-ubi.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha we kpughepu Onwe-ya na ntim abua, si, N'ezie agaghi-ekpuchiri unu ajọ omume a rue mb͕e unu gānwu, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, siri.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēji éb͕è-elu-igwe, ji kwa ala-ọma-jijiji, na oké olu, na oké ifufe na ikuku uku, na ire-ọku nke -ọku nērichapu erichapu, leta ya.


Le, ọ bu ihe edeworo n'akwukwọ n'irum: M'gaghi-agba nkiti, kama M'gākwughachi, e, M'gākwughachi n'obi-ha,


ajọ omume nile nke unu na ajọ omume nile nke ndi bu nna-unu n'otù, ka Jehova siri, bú ndi sureworo ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ugwu nile, takwam uta n'elu ugwu ntà nile: M'gēbu kwa uzọ tùa ọlu-ha n'obi-ha.


Ge nti, olu nkpọtu nēsite n'obodo, olu nēsite n'ulo uku Chineke, bú olu Jehova Onye nākwughachi ndi-iro-Ya nmeso-ha.


O we sim, Nwa nke madu, Gì onwe-gi nāhu ihe ha onwe-ha nēme? bú ihe-árú nile di uku nke ulo Israel nēme n'ebe a, ka M'we si n'ebe nsọm je n'ebe di anya? ma i gāhu kwa oké ihe-árú ọzọ di iche iche.


Unu ndi nēnweghi uche, Onye ahu Nke mere azú iko, ọ̀ bughi Ya me-kwa-ra ime-ya?


ka ewe chọputa ọbara ndi-amuma nile, nke awusiworo site na ntọ-ala uwa, n'aka ọb͕ọ a;


n'ihi na ha wusiri ọbara ndi nsọ na ndi-amuma, ọbara ka I nyewo-kwa-ra ha ka ha ṅua: ha bu ndi kwesiri ekwesi.


Ọ bu kwa nime ya ka ahuru ọbara nke ndi-amuma na nke ndi nsọ, na nke ndi nile eb͕uworo n'elu uwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan