Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 26:17 - Bible Nso

17 Dika nwayi nke di ime, nke gaje imu nwa, si ab͕ali nb͕ali, tie nkpu n'aru-ufu-ya nile; otú a ka ayi diworo n'iru Gi, Jehova.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Gị, Onyenwe anyị, emeela ka anyị kwaa akwa, dị ka nwanyị ime na-eme si ata ikikere eze na akwa akwa nʼihi ihe mgbu. Otu a ka anyị nọ nʼihu gị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 26:17
11 Iomraidhean Croise  

Nwayi ahu ka Ọ siri, M'gēme ka ihe-nb͕u-gi na itu-ime-gi ba uba nke-uku; n'ihe-nb͕u ka i gāmu umu; n'ebe di-gi nọ ka ọchichọ-gi gādi, ya onwe-ya gāchi kwa gi.


Ọma-jijiji jidere ha n'ebe ahu; Ihe-nb͕u, dika nke nwayi nāmuputa nwa.


ha gāma kwa jijiji; aru-ufu na ihe-nb͕u ka ha gēnwezu; dika nwanyi ime nēme, otú a ka ha gāb͕ali: ọ gēju ha anya, otù n'ebe ibe-ya nọ; iru nke bu nání ire-ọku ka iru-ha gābu.


N'ihi nka ka úkwùm juputara na nb͕ali; aru-ufu ka m'nwezuru, dika aru-ufu nile nke nwayi ime nēme: ab͕agọrọm ab͕agọ, m'we ghara inu ihe; amaram jijiji, m'we ghara ihu uzọ.


Ha we si ya, Otú a ka Hezekaia siri, Ubọchi ahuhu na iba-nba na nlelì-anya ka ubọchi ta bu: n'ihi na umu abiaruwo ebe-nmuputa, ma ike adighi imu ha.


Biko, juanu, hu ma ime nēme nwoke: gini mere M'huworo ndikom nile n'otù ka aka-ha di n'úkwù-ha, dika nwanyi ime nēme, iru nile ab͕anwewo kwa we di ka nke ozu?


N'ihi na olu dika nke nwanyi ime nēme ka m'nuworo, ihe-nb͕u dika nwanyi nāmu nwa mbu ya, bú olu nke ada Zaion, o nēku ike ike, ọ nāb͕asa ọbu-aka-ya abua, si, Ahuhu dirim nọ̄! n'ihi na nkpuru-obim nāda #mbà n'iru ndi-ob͕u-madu.


Ayi anuwo ùdé-ya; aka-ayi akudawo: ihe-nb͕u ejidewo ayi, ihe-nb͕ali dika nke nwayi ime nēme.


Nwanyi, mb͕e ọ bula ime nēme ya, o nwere ihe-nwuta, n'ihi na oge hour ya abiawo: ma mb͕e ọ bula ọ muputara nwa, o chetaghi ahuhu-ya ọzọ, n'ihi ọṅù-ya na amuputara madu n'uwa.


Mb͕e ha nāsi, Udo na ntukwasi-obi di, mb͕e ahu na mberede ka nbili nābiakwasi ha, dika ime nēme nwanyi nke di ime; ha agaghi-ab͕anari kwa ya ma-ọli.


ọ di kwa ime: o we tie nkpu, ebe ime nēme ya, anēmekpa kwa ya aru imuputa nwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan