Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 25:6 - Bible Nso

6 Ọ bu kwa n'ugwu a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēmere ndi nile di iche iche oké oriri nke ihe mara abuba, bú oké oriri nke ezi manya-vine doro edo, nke ihe mara abuba juputara n'umi, nke manya-vine doro edo azara nke-ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Nʼelu ugwu a, ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-anọ kwadooro ụwa niile oke oriri. Ọ ga-abụ oke oriri nke ga-adịrị ndị niile. Oke oriri nke ezi anụ na mmanya dị mma ga-adị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 25:6
30 Iomraidhean Croise  

Afọ nējubiga ha ókè site n'abuba nke ulo-Gi; Ọ bu kwa miri-iyi nke ihe-utọ-Gi nile ka I nēme ka ha ǹua.


Afọ nēju nkpuru-obim dika agāsi na o rijuru umi-anu na abuba afọ; Ọ bu kwa eb͕ub͕ere-ọnu nke nēti nkpu ọṅù ka ọnum nēji to Gi;


Kama Ọ rọputara ebo Juda, Rọputa ugwu Zaion, nke Ọ huru n'anya.


Ya were nsutu nile nke ọnu-ya sutum: N'ihi na ihu-n'anya-gi nile di nma kari manya-vine.


Dọrọm; gi ka ayi gāb͕aso: Eze emewo ka m'ba n'ime-ulo-ya: Ayi gēteghari egwú ọṅù ṅuri kwa nime gi, Ayi gēhota ihu-n'anya-gi nile kari manya-vine: N'izi-ezi nile ka ha huworo gi n'anya.


Abatawom n'ubim ab͕ara ogige, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem: Aghọrọwom myrrh nkem, ya na udam; Arachawom ub͕ub͕ọ-manu-aṅum, ya na manu-aṅum; Aṅuwom manya-vine nkem, ya na miri-ara-ehim. Rienu ihe, ndi-eyim; Ṅuanu ihe-ọṅuṅu, e, ṅujuenu afọ unu ndi ihe-unu nātọm utọ.


Ọ buru na unu ekwe, we nu, ezi ihe nke ala-unu ka unu gēri:


N'ihi na aka Jehova gānọgide n'ugwu a, ewe zọda Moab n'ọnọdu-ya, dika esi azọda okporo-ọka nime miri nke olùlù ikpo ǹsí-anu.


M'gēme ka ha biarue ugwu nsọm, M'gēme kwa ka ha ṅuria n'ulo-ekperem; àjà-nsure-ọku nile ha na àjà nile ha gābu ihe nātọ utọ n'elu ebe-ichu-àjàm: n'ihi na agākpọ ulom ulo ekpere diri ndi nile di iche iche.


Onye nānọ jū ka Moab bu site na mb͕e ọ di na nwata, ọzọ, manya-vine doro edo ka ọ bu, esighi kwa n'otù ihe b͕aye ya n'ihe ọzọ, o jeghi kwa n'etiti ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ: n'ihi nka ka utọ-ya guzoworo nime ya, ísì-ya ab͕anweghi kwa.


Ọ bu kwa ya ka enyere ọchichi, na ebube, na ala-eze, ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nile nāsu asusu di iche iche we fè Ya: ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, nke nāgaghi-agabiga, ọ bu kwa ala-eze-Ya bu nke anāgaghi-emebi.


Otú a ka Jehova siri: Alaghachiwom na Zaion, M'gēbi kwa n'etiti Jerusalem: agākpọ kwa Jerusalem Obodo ezi-okwu; agākpọ kwa ugwu nke Jehova nke usu nile ndi-agha Ugwu nsọ.


Ma asim unu, M'gaghi-aṅu ma-ọli site n'ub͕u a n'ihe a si n'osisi vine puta, rue ubọchi ahu mb͕e Mu na unu gāṅu ya ọhu n'ala-eze Nnam.


Ma asim unu, na ọtutu madu gēsi n'Ọwuwa-anyanwu na Ọdida-anyanwu bia, so kwa Abraham, na Aisak, na Jekob, nānọdu n'ala-eze elu-igwe:


O we si ha, Ganu n'uwa nile, kwusara ihe nile ekère èkè ozi ọma nkem.


ka unu we rie ṅu kwa na table nkem n'ala-ezem; unu gānọkwasi kwa n'oche-eze nēkpe ebo iri na abua nke Israel ikpé.


Ọzọ kwa, ọ dighi onye ọ bula, mb͕e ọ ṅuworo manya-vine ochie, nāchọ nke-ọhu: n'ihi na ọ si, Nke-ochie di nma.


kama unu abiaruwo ugwu Zaion, na obodo nke Chineke di ndu, bú Jerusalem nke di n'elu-igwe, na ọtutu ndi anāpughi iguta ọnu,


O we sim, De akwukwọ, Ngọzi nādiri ndi akpọworo ibia na nri-anyasi ọlulu-nwunye nke Nwa-aturu ahu. O we sim, Ndia bu okwu nke Chineke kwuru n'ezie.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan