Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 24:22 - Bible Nso

22 Ewe chikọta ha, dika esi achikọta ndi-nkpọrọ n'olùlù, agēmechibido kwa ha n'ulo-nkpọrọ, mb͕e ubọchi gasiri agēleta ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ, kpọchiekwa ha nʼụlọ mkpọrọ nʼebe ahụ ka ha ga-anọgide, tutu ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 24:22
11 Iomraidhean Croise  

Ọ bu nání na ọ makpuworo n'ọnọdu onye-nkpọrọ, ọ bu kwa n'ọnọdu ndi eb͕uru eb͕u ka ha gāda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Madu gābà kwa n'ọb͕à nile nke oké nkume nile, na n'olùlù nile nke ájá, ipu n'iru oké egwu Jehova, na ipu n'ima-nma nke nbili-elu-Ya, mb͕e O biliri ime ka uwa ma jijiji nke-uku.


Oké egwu na olùlù na ib͕udu nādikwasi gi, gi onye bi n'uwa.


Ma ndi nka bu ndi alutaworo ihe-ha n'agha na ndi apunaraworo ha ihe; ha adawo n'ib͕udu n'olùlù, ha nile, ọ bu kwa n'ulo-nkpọrọ di iche iche ka ezobeworo ha: ha aghọwo ihe-nluta-n'agha, ma ọ dighi onye-nnaputa; ha aghọwo ihe apunaraworo madu, ma ọ dighi onye nāsi, Nyeghachi.


Mb͕e ọtutu ubọchi gasiri agēleta gi: n'ikpe-azu nke arọ ndia ka i gābà n'ala nke emeworo ka o si na mma-agha lata, nke achikọputaworo n'ọtutu ndi di iche iche, n'elu ugwu nile nke Israel, nke ghọworo nkpọnkpọ ebe mb͕e nile: ma emewo ala ahu ka o si n'etiti ndi di iche iche puta, ha gēbi kwa na ntukwasi-obi, ha nile.


Gi onwe-gi kwa, n'ihi ọbara ọb͕ub͕a-ndu-gi ka M'zipuworo ndi-nkpọrọ-gi n'olùlù nke miri nādighi nime ya.


Laghachinu n'ebe ewusiri ike, unu ndi-nkpọrọ nke olile-anya ahu: ọbuná ta ka M'nēgosi na ọ bu okpukpu abua ka M'gēnyeghachi gi.


O we jide dragon ahu, bú agwọ ochie ahu, onye bu Ekwensu na Setan, o we ke ya ab͕u nnù arọ abua na ọgu iri,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan