Ha gārọputa kwa ọnwu kari ndu, bú ndi nile fọduru, ndi fọduru site n'ab͕uru ọjọ a, ndi fọduru n'ebe nile M'chusaworo ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke ndi-agha puta.
I nākpọ, dika n'ubọchi nke mb͕e akara àkà, ujọm nile di buruburu, Ọ dighi kwa onye b͕apuru ab͕apu ma-ọbu onye fọduru afọdu n'ubọchi nke iwe Jehova: Umum ndi m'tughariworo n'aka zulite, onye-irom emewo ka ha gwusia.
M'gāb͕asa kwa ub͕um n'aru ya, agāma kwa ya n'ọnyàm: M'gēme kwa ka ọ biarue Babilon, bú ala ndi Kaldea; ma ala ahu ka ọ nāgaghi-ahu, ma n'ebe ahu ka ọ gānwu.
N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Àgēsi kwa aṅa naputa ya ma-ọli mb͕e ọ bu ikpém anọ jọrọ njọ, bú mma-agha na oké unwu na ajọ anu-ọhia na ajọ ọria nēfe efe, ka M'zigara na Jerusalem, ibipu madu na anumanu nime ya?