Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 24:15 - Bible Nso

15 N'ihi nka sọpurunu Jehova n'ala ìhè nile, sọpurunu aha Jehova, bú Chineke Israel, n'ala nile nke di oké osimiri buruburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto. Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburu ga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 24:15
26 Iomraidhean Croise  

Eze, bú Ahasuerọs, we me ka ala ahu na ala nile nke di oké osimiri buruburu tua utu.


Unu gāsi kwa n'ubọchi ahu, Kelenu Jehova, kpọkuenu aha-Ya, menu ka amara omume-Ya nile n'etiti ndi nile di iche iche, hotanu na emewo ka aha-Ya di elu.


N'ihi nka ka ndi di ike gāsọpuru Gi, obodo nke ndi-mba ndi nēme ka madu ma jijiji gātu egwu Gi.


Ọzọ, n'uzọ nke ikpé-Gi nile, Jehova, ka ayi leworo anya Gi: aha-Gi na ncheta-Gi nāti nkpuru-obi-ayi akpiri.


Agwe-etiti nile huru, we tua egwu; nsọtu nile nke uwa nāma jijiji: ha biaruru nso, we bia.


Bùkuenu Jehova abù ọhu, kwusanu otuto-Ya site na nsọtu uwa; unu ndi nārida n'oké osimiri, na ùjú-ya, agwe-etiti nile, na ndi bi ha.


Ka ha nye Jehova nsọpuru, gosi kwa otuto-Ya n'agwe-etiti nile.


Ọ gaghi-enwu inyoghi-inyoghi, agaghi-apia kwa ya apia n'obi, rue mb͕e o gēdowori ikpé n'uwa; ọ bu kwa iwu-ya ka agwe-etiti nile gēchere.


Genum nti, unu agwe-etiti; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi di iche iche, site n'ebe di anya: Jehova esitewo na mb͕e m'nọ n'afọ kpọm; site na mb͕e m'nọ n'afọ nnem ka O hotaworo aham:


Ezi omumem di nso, nzọputam aputawo, ogwe-akam abua gēkpe ndi nile ikpe; agwe-etiti nile gēle anyam, ọ bu ogwe-akam ka ha gēchere.


N'ezie Mu ka agwe-etiti nile gēchere, ub͕ọ nile nke Tashish gēbu kwa uzọ, ime ka umu-gi ndikom si n'ebe di anya bia, ha na ọla-ọcha-ha na ọla-edo-ha, ibiakute aha Jehova, bú Chineke-gi, na ibiakute Onye Nsọ nke Israel, n'ihi na O mewo ka i ma nma.


M'gēdo kwa ihe-iriba-ama n'etiti ha, si kwa n'etiti ha ziga ndi b͕aputara ab͕aputa ka ha jekuru mba nile, bú Tashish, na Pul, na Lud, ndi nādọ uta, jekuru Tubal na Jevan, jekuru agwe-etiti nile di anya, ndi nānughi ihe bayerem, ndi nāhughi kwa ebubem: ha gēgosi ebubem n'etiti mba nile.


Onye di egwu ka Jehova gābu n'imegide ha: n'ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n'ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile.


N'ihi na site n'ọwuwa anyanwu we rue ọdida-ya aham di uku n'etiti mba nile; ọ bu kwa n'ebe nile ọ bula ka anēweta nso aham ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ na onyinye-inata-iru-ọma di ọcha: n'ihi na aham di uku n'etiti mba nile, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri.


Ma dika n'etiti abali Pọl na Sailas nēkpe ekpere nābùku kwa Chineke abù, ndi-nkpọrọ we nēge nti n'olu-ha;


ka ewe nye aha Onye-nwe-ayi Jisus otuto nime unu, nye kwa unu onwe-unu otuto nime Ya, dika amara nke Chineke-ayi na Onye-nwe-ayi Jisus Kraist si di.


ka nnwaputa nke okwukwe-unu, ebe ọ dikariri ọla-edo oké ọnu-ahia nke-uku, bú ọla-edo nke nāla n'iyì, ọ bu ezie na anēji ọku nwaputa ya, ka ewe hu nnwaputa ahu na ọ nēweta otuto na ebube na nsọpuru nime nkpughe nke Jisus Kraist:


kama donu Kraist-ayi nsọ nime obi-unu dika Onye-nwe-unu: buru-kwa-nu ndi edoziworo mb͕e dum igọpuru onye ọ bula nke nāju unu ajuju bayere olile-anya ahu nke di nime unu, ma ka unu were nwayọ na egwu gọpu:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan