Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 24:12 - Bible Nso

12 Nke fọduru n'obodo bu ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ bu kwa ntikpọ ka eji tie ọnu-uzọ-ama.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Obodo ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe, e tikpọọla ọnụ ụzọ ya niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 24:12
12 Iomraidhean Croise  

Kwasie ákwá ike, gi ọnu-uzọ-ama; tie nkpu, gi obodo; i b͕azewo, Filistia, ka i ra; n'ihi na n'Ugwu ka anwuru-ọku si bia, ọ dighi kwa onye ọ bula nēguzo iche na mb͕e-ya nile akara àkà.


n'ihi na arapuwo ulo-elu; ab͕anariwo ìgwè obodo; Ofel na ulo nche anọchiwo n'ọnọdu ọb͕à rue mb͕e ebighi-ebi, ebe obi-utọ nke inyinya-ibu-ọhia, ebe-ita-nri nke ìgwè aturu di iche iche;


Ma o gēzo ákú-miri-ígwé, n'ọdida nke oké ọhia; ọ bu kwa n'ọnọdu di ala ka agēme ka obodo a di ala.


Mu onwem gāga n'iru-gi, me ka nkputankpu ebe nile guzozie: ibo-ọnu-uzọ ọla nile ka M'gētiwa, ihe-ntuchi ígwè nile ka M'gēb͕ujipu kwa:


M'gēme kwa Jerusalem ka ọ ghọ obo-ihe obo-ihe, ebe-obibi nke nkita-ọhia; ọzọ, obodo nile nke Juda ka M'gēme ka ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, onye-obibi we ghara idi.


Le, ka obodo ahu nke ndi-ya di ọtutu si nọdu ala nání ya! Le, ka o siworo ghọ ihe di ka nwanyi di-ya nwuru! Obodo nke riri nne n'etiti mba nile, nke bu isi n'etiti ala nile anāchi achi, Le, ka o siworo ghọ usu ndi nēfè òfùfè.


Uzọ nile nke Zaion nēru újú, n'ihi na ọ dighi ndi nābia na mb͕e akara àkà; Ọnu-uzọ-ama-ya nile tọb͕ọrọ n'efu; ndi-nchu-àjà-ya nēze ume:


Ọnu-uzọ-ama-ya nile emikpuwo n'ala; O mewo ka ihe-ntuchi-ya nile la n'iyì, Ọ b͕ajiwo kwa ha: Eze-ya na ndi-isi-ya nọ n'etiti mba nile ebe iwu nādighi; Ọzọ, ndi-amuma-ya achọtaghi ọhù nke sitere na Jehova.


N'ihi ugwu Zaion, nke tọb͕ọrọ n'efu; Nkita-ọhia ejeghariwo na ya.


N'ihi na nwanyi bi na Marot echerewo inwe ezi ihe: n'ihi na ihe ọjọ esiwo n'ebe Jehova nọ ridarue ọnu-uzọ-ama Jerusalem.


N'ihi na ihe nādighi ngwọta ka ntiputa-ọnyá nile bu: n'ihi na ọ biaruwo Juda; o rutewo ọnu-uzọ-ama ndim, rue Jerusalem.


Ma eze ahu were iwe; o we ziga usu-ndi-agha-ya nile, la ndi-ob͕u-madu ahu n'iyì, rechapu kwa obodo-ha ọku.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan