Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 23:13 - Bible Nso

13 Le, ala ndi Kaldea; ndi nka adighi; Asiria edoziworo ya anu-ọhia nile nke biri n'ala kpọrọ nku: ha mere ka ulo-nche-ya nile guzosie ike, ha tikpọrọ ulo-elu-ya nile; o mere ya ka ọ ghọ ebe dara ada.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Lee anya nʼala ndị Kaldịa, ndị a gụpụrụla ugbu a na mmadụ! Ndị Asịrịa mere ya ka ọ bụrụ ebe obibi nye anụ ọhịa na-ebi nʼọzara. Ha wuliri ụlọ nche ha niile dị elu gburugburu tikpọọ ebe ya niile e wusiri ike, mee ha ka ha tọgbọrọ nʼefu ghọọ mkpọmkpọ ebe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 23:13
23 Iomraidhean Croise  

Heran we nwua n'iru nna-ya Tira n'ala amuru ya, n'Ua nke ndi Kaldea.


Tira we chiri Abram, bú nwa-ya nwoke, na Lot, bú nwa-nwoke nke Heran, ya bu nwa nwa-ya, na Serai, bú nwunye nwa-ya, bú nwunye Abram nwa-ya nwoke; ha na ha we si n'Ua nke ndi Kaldea pua, ije ala Kenean; ha biarue Heran, biri n'ebe ahu.


N'ihi nka ka akpọrọ aha-ya Bebel; n'ihi na n'ebe ahu ka Jehova ghab͕uru asusu uwa nile: ọ bu kwa n'ebe ahu ka Jehova mere ka ha si b͕asa n'elu uwa nile.


Aha osimiri nke-atọ bu Hidekel: nke ahu bu nke nāga Asiria n'Iru-anyanwu. Osimiri nke-anọ bu Yufretis.


Eze Asiria we me ka madu si na Babilon, si kwa na Kuta, si Kwa n'Ava, si kwa na Hemat na Sefavaim, bia, o me ka ha biri n'obodo nile nke Sameria n'ọnọdu umu Israel: ha we nweta Sameria, biri n'obodo-ya nile.


Na mb͕e ahu Berodak-baladan nwa Baladan, bú eze Babilon, zigara Hezekaia akwukwọ na onyinye-inata-iru-ọma: n'ihi na ọ nuru na Hezekaia riarárí ọria.


Jehova we me ka ndi-isi usu-ndi-agha nke eze Asiria nwere biakwasi ha, ha we jide Manase n'ọhia-ogwu, were ihe ọla eji ke ukwu ab͕u ke ya ab͕u, me ka o jerue Babilon.


Mb͕e onye a nọ nēkwu, onye ọzọ bia-kwa-ra, si, Ndi Kaldea doro usu atọ, made imegide camel, chiri ha, ọzọ kwa, ha were ọnu mma-agha tib͕ue ndi nējere gi ozi; nání mu onwem we b͕apu, náním, igosi gi.


Ndi bi n'ala kpọrọ nku gēruru ala n'iru ya; Ọzọ, ndi-iro-ya gāracha ájá.


Ahuhu gādiri Asiria, bú ndele nke iwem, nkpa-n'aka ka ọ bu kwa n'aka-ha, bú oké iwem!


Ma ya onwe-ya, ọ bughi otú a ka ọ nēzube, obi-ya kwa, ọ bughi otú a ka ọ nēchè; kama ikpochapu ekpochapu di n'obi-ya, ya na ibipu ọtutu mba.


Babilon, bú ihe mara nma nke ala-eze nile, ima-nma nke npako ndi Kaldea, ọ gādi ka mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra.


Ma anu-ọhia di iche iche bi n'ala kpọrọ nku gāmakpu n'ebe ahu; ulo-ha gējuputa kwa n'okwukwu; enyi-nnunu gēbi kwa n'ebe ahu, nkpi gāmali kwa elu n'ebe ahu.


Agārapu ha n'otù nye udele nke ugwu, nye kwa anu-ọhia nke uwa: udele gānọkwasi kwa ha ogologo mb͕e okpom-ọku, anu-ọhia nke uwa gānọkwasi kwa ha ogologo mb͕e oyi.


Otú a ka Jehova siri, bú onye-nb͕aputa-unu na Onye Nsọ nke Israel: n'ihi unu ka M'ga-eziga ozi na Babilon, M'gēme kwa ka ha rida dika ndi-ọ̀só, ha nile, ọbuná ndi Kaldea, n'ugbọ nile nke iti-nkpu-ọṅù-ha.


bú umu Babilon na Kaldea nile, na Pekod na Shoa na Koa, ha na umu Asiria nile: bú umu-okorọbia anāchọsi ike, ndi nāchi ala na ndi nọchiri anya eze ka ha nile bu, ha bu ndi-isi-agha na ndi akpọrọ akpọ, ndi nānọkwasi n'inyinya ka ha nile bu.


Nwa nke madu, Nebukadreza, bú eze Babilon, mere ka usu-ndi-agha-ya fè òfùfè uku megide Taia: isi nile ọ bula ka emere isi-nkwọcha, ubu nile ọ bula ka echihiara echihia: ma ọ dighi ugwọ-ọlu ọ natara, ọ dighi kwa nke usu-ndi-agha-ya natara, n'aka Taia, n'ihi òfùfè ahu o fère megide ya.


Eze zara, si, Ọ̀ bughi nka bu Babilon uku a, nke mu onwem wuworo ibu ulo ala-eze, site n'ike nke àkùm na n'ihi ebube nke ima-nmam?


N'ihi na, le, M'gaje ime ka ndi Kaldea bilie, bú mba ahu di ilu nke nēme kwa ngwa ngwa; ndi nējeghari na mbara uwa, inweta ebe-obibi di iche iche nke nābughi nke ha.


Mb͕e ahu o siri n'ala ndi Kaldea puta, we biri na Heran: mb͕e nna-ya nwuru, Chineke we me ka o site n'ebe ahu bia biri n'ala nka, nke unu onwe-unu bi nime ya ub͕u a:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan