Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 22:13 - Bible Nso

13 ma, le, obi-utọ na ọṅù, ob͕ub͕u ìgwè ehi na ob͕ub͕u ìgwè ewu na aturu, oriri anu na ọṅuṅu manya-vine: ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ma lee, e nwere obi ụtọ, na-egwuri egwu; igbu ehi na igbu atụrụ, iri anụ nakwa ịṅụ mmanya. Unu na-asị, “Ka anyị rienụ, ṅụọkwanụ, nʼihi na echi ka anyị ga-anwụ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 22:13
16 Iomraidhean Croise  

Asi na emere onye nēmebi iwu amara, ọ gaghi-amuta ezi omume; n'ala nke izi-ezi nile ọ gēme ajọ omume, ma ọ gaghi-ahu idi-elu nke Jehova.


Ahuhu gādiri Eriel, Eriel, bú obodo ebe Devid mara ulo-ikwū-ya! Tukwasinu arọ n'arọ; ka ememe nile b͕agharute na mb͕e-ha:


Ma ub͕u a nuru nka, gi nwanyi nēme ka o si tọ gi utọ, gi onye nānọ na ntukwasi-obi, nke nāsi n'obi-gi, Mu onwem nọ, ọ dighi kwa otù efu ọzọ di ma ewezuga nání mu onwem; m'gaghi-anọ dika nwanyi di-ya nwuru, m'gaghi-ama kwa ọb͕ub͕a-aka-umu:


Ahuhu gādiri ndi nēbili n'isi-ututu ib͕aso ihe-ọṅuṅu nābà n'anya; ndi nānọ ogologo mb͕e n'anyasi, manya-vine ewe me ka aru nwuru ha ọku.


Ubọ-akwara na une na egwú-otiti na ọ̀jà na manya-vine di kwa n'ọṅuṅu-manya-vine-ha nile: ma ha adighi-elegide ọlu Jehova anya, ha ahughi kwa ihe aka-Ya abua nēme.


Ahuhu gādiri ndi-dike n'iṅu manya-vine, ndi bu kwa dìnkpà n'itigwa ihe-ọṅuṅu n'anya:


Ha si, Bianu, ka m'weta manya-vine, ka ayi ṅubiga kwa ihe-ọṅuṅu nābà n'anya ókè; echi gādi kwa ka ta, ubọchi di uku gabiga ókè nke-uku.


Ha si, N'ìhi gini ka ayi būworo ọnu, ma I hughi? n'ìhi gini ka ayi wedaworo nkpuru-obi-ayi n'ala, ma I dighi-ama? Le, n'ubọchi obubu-ọnu-unu unu nāchọputa ihe nātọ unu utọ, ọ bu kwa ihe nile nke putara na ndọb͕u ndi-ọlu-unu nādọb͕u onwe-ha n'ọlu ka unu nānara n'ihe-ike.


Le, nka bu ajọ omume nke Sọdọm, bú nwa-nne-gi nwanyi; npako, na afọ ojuju nri, na udo nke inọ-jū, diri ya na umu-ya ndinyom; ma o meghi ka aka nke onye ewedara n'ala na ob͕eye di ike.


Aṅurila, Israel, rue otite-egwú-ọṅù, dika ndi nile di iche iche; n'ihi na i puwo n'aka Chineke-gi kwaba iko, i huwo onyinye n'anya n'ebe-nzọcha-ọka nile.


Ọ buru na abumri onye nālu ọ̀gù megide anu-ọhia n'Efesọs dika madu si eme, ùrù gini baram? Ọ buru na emeghi ka ndi nwuru anwu si n'ọnwu bilie, ka ayi rie ṅu kwa, n'ihi na echi ka ayi gānwu.


Unu biri n'oké oriri na ọṅuṅu n'elu uwa, di kwa ndu ọjọ dika ọ nātọ aru-unu utọ; unu zùru obi-unu n'ubọchi ob͕ub͕u.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan