Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 21:12 - Bible Nso

12 Onye-nche siri, Ututu abiawo, ma abali abiawo kwa: ọ buru na unu gāju ase, juanu ase: laghachinu, bia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Onye nche zara sị, “Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ, ma laghachikwa ọzọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 21:12
16 Iomraidhean Croise  

Na mb͕e anyasi le, oké egwu di: tutu ututu erue ọ dighi. Nka bu òkè nke ndi nāpunara ayi ihe; na ihe ruru ha n'ife-nzà, bú ndi nāluta ihe-ayi n'agha.


Ibu eboro Duma. Mu ka otù onye nākpọ òkù site na Sia, si, Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali? Onye-nche, #mb͕e ole gabigaworo n'abali?


Ibu ebero Arebia. N'oké ọhia di n'Arebia ka unu gānọ ọnọdu-abali, unu usu-ije nile nke ndi Dedan.


onye nēmebi iwu, ya rapu uzọ-ya, onye nēme ajọ ihe, ya rapu èchìchè-ya nile: ya laghachikute kwa Jehova, Ọ gēnwe kwa obi-ebere n'aru ya; ya laghachikute kwa Chineke-ayi, n'ihi na Ọ gāb͕aghara ya nmehie-ya n'uba.


Gbuenu oke-ehi-ya nile; ka ha rida ka ewe b͕ue ha: ahuhu diri ha! n'ihi na ubọchi-ha abiawo, bú mb͕e nleta-ha.


Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?


Le, ubọchi ahu, le, ọ nābia: chi-ọbubọ-gi aputawo; nkpa-n'aka ab͕awawo okoko, nganga amawo ifuru.


Mb͕e ahu abiawo, ubọchi ahu eruwo nso: ka onye nāzu azu ghara iṅuri ọṅu, ka onye nēre ere ghara kwa iru újú: n'ihi na iwe di ọku diri ìgwè madu-ya nile.


Ọhù Obadaia. Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri bayere Edom: Ayi anuwo ihe-ọnunu sitere n'ọnu Jehova, ezigawo kwa ukọ̀ n'etiti mba nile, si, Bilienu, ka ayi bilie imegide ya n'agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan