Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 21:1 - Bible Nso

1 Ibu eboro ọzara nke oké osimiri. Dika oké ifufe nke di nime Negeb nēfebiga, n'ọzara ka o siworo bia, site n'ala di egwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri: Dịka oke ifufe si nʼọzara Negeb na-efebiga, ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa, site nʼala nke oke egwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 21:1
21 Iomraidhean Croise  

N'ime-ulo Ndida ka oké ifufe nēsi bia: Ọ bu kwa n'Ugwu ka oyi nēsi bia.


Ibu eboro Babilon, nke Aisaia nwa Emoz huru.


N'ihi ya ọbuná elu-igwe ka M'gēme ka ha ma jijiji, uwa gēme kwa nkpatu pua n'Ọnọdu-ya, nime nrubiga-ókè nke iwe Jehova nke usu nile nke ndi-agha, na n'ubọchi iwe-Ya di ọku.


N'ihi na Jehova gēnwe obi-ebere n'aru Jekob, Ọ gārọputa kwa Israel ọzọ, do ha n'ala-ha: ọbìa gārapara kwa n'aru ha, ha gēme kwa onwe-ha ka ha na ulo Jekob dikọ n'otù.


m'gārigo n'elu ebe nile di elu nke igwe-oji; m'gēyi Onye kachasi ihe nile elu.


M'gēme kwa ya ka ọ ghọ ihe-nnweta nke ebinta, na ọdọ-miri ọdọ-miri; M'gewere kwa aziza, bú nkpochapu, zachapu ya; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.


Ibu eboro Damaskọs. Le, ewezugawo Damaskọs n'ibu obodo, o we ghọ obo-ihe dara ada.


Rida, we nọdu n'ájá, gi nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, bú ada Babilon; nọdu n'ala ghara inwe oche-eze, gi ada ndi Kaldea: n'ihi na i gaghi-abu kwa onye ha nākpọ nwanyi di nrò nke di kwa pekepeke.


ndi àkú-ha nile di nkọ, uta-ha nile ka azọrọ ukwu ikwe ha; aguwo ukwu inyinya-ha nile dika ọmu, na wheel-ha nile dika oké ifufe:


Otú a ka Jehova siri: Le, M'gaje ikpọte ifufe nke nēbibi ebibi megide Babilon, na n'ebe ndi bi na Leb-kamai nọ.


Oké osimiri erukpuwo Babilon: ejiwo nkpọtu nmali-miri-ya nile kpuchie ya.


Ihere emewo ayi, n'ihi na ayi anuwo ita-uta; ọnọdu-ihere etiyere ayi nime ya ekpuchiwo ayi n'iru: n'ihi na ndi ala ọzọ abàwo imegide ebe nsọ nile nke ulo Jehova.


M'we hu, ma, le, oké ifufe nēsi n'Ugwu bia, oké igwe-oji, na ọku nke nānwude onwe-ya mb͕e nile, onwunwu di-kwa-ra ya buruburu, ọ bu kwa n'etiti ya, bú n'etiti ọku ahu, ka ihe dika amber n'ile ya anya nēb͕upu.


Ya onwe-ya na ndi-ya so ya, bú ndi kachasi mba nile n'ime ka madu ma jijiji, agaje ime ka ha bata ibibi ala ahu; ha gāmiputa kwa mma-agha-ha imegide Ijipt, ha gēmeju kwa ala ahu na ndi eb͕uru eb͕u.


Ndi ala ọzọ, bú ndi kariri mba nile n'ime ka madu ma jijiji, we bipu ya, tusa ya: n'elu ugwu nile na nime ndagwurugwu nile ka alaka-ya daworo, ewe nyajie alaka-ya nile nke akwukwọ-ha kpuchiri ha n'ebe nile miri si erù nke ala-ya; ndi nile nke ala ahu esiwo kwa na ǹdò-ya rida, ha we tusa ya.


I gārigo kwa, dika ikuku siri ike ka i gābia, dika igwe-oji ikpuchi ala ka i gādi, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ọtutu ndi di iche iche so gi.


Ma na mb͕e nke ọgwugwu ihe ndia eze Ndida gāmalite isọ ya mpi: eze Ugwu ewe dakwasi ya dika oké ifufe, chiri ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya, chiri kwa ọtutu ub͕ọ; ọ gābà kwa n'ala-ya nile, rubiga ókè dika miri, gabiga.


Ọ bu kwa Jehova ka agāhu n'elu ha, àkú-Ya gāpu kwa dika àmùmà: Onye-nwe-ayi Jehova gāfù kwa opì-ike, je ije n'oké ifufe di iche iche nke Ndida.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan