Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 20:4 - Bible Nso

4 otú a ka eze Asiria gēdulaga ndi Ijipt adọtara n'agha, na ndi Etiopia emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ma umu ntà ma ndi-okenye, b͕ara ọtọ na ukwu efu, b͕a kwa ọtọ n'otule, ib͕aba Ijipt ọtọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Nʼihi na otu a ka eze Asịrịa ga-esi kpụrụ ndị Ijipt na ndị Kush ọ dọtara nʼagha. Ha ga-agba ọtọ na-ejegharị nʼụkwụ efu, ma nwantakịrị ma okenye. Otule ha gba ọtọ ga-abụrụ Ijipt ihe ihere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 20:4
18 Iomraidhean Croise  

Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu nkera nke afu-ọnu-ha, bipu kwa uwe-nwuda-ha n'etiti, rue otule-ha, we zilaga ha.


Hanun we were ndi-orù Devid, kọpu ha afu-ọnu, bipu kwa uwe-nwuda-ha n'etiti, rue otule-ha, we zilaga ha.


M'gēmechibido Ijipt n'aka onye-nwe-ha nēme ihe-ike; eze di ike gāchi kwa ha, ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, puta.


n'ihi nka Onye-nwe-ayi gēme kwa ka ọnyá di n'opu-n'isi umu-ndinyom Zaion, Jehova ga-agbaba kwa ha ọtọ.


Ma Ya onwe-ya ma-kwa-ra ihe, we me ka ihe ọjọ bia, O wezugakwaghi okwu-Ya nile: ma O biliwo imegide ulo ndi nēme ihe ọjọ na imegide iye-aka nke ndi nālu ajọ ihe.


Ma ndi Ijipt bu madu, ha abughi Chineke; inyinya-ha bu kwa anu-aru, ha abughi mọ: Jehova gēseti kwa aka-Ya, onye nēye aka ewe su ngọngọ, onye anēyere aka adà kwa, ọ bu kwa n'otù ka ha nile gāgwusi.


Were nkume-igwe-nri gwe utu ọka: kpupu ákwà-nkpuchi-gi, yipu uwe-nwuda-gi, kpughepu ogwe-ukwu-gi, gabiga osimiri di iche iche.


Agēkpughe ọtọ-gi, e, agāhu ita-uta-gi: ọ́bọ̀ ka M'gābọ̀, M'gaghi-ezute madu.


Ma mb͕e i gāsi n'obi-gi, Gini mere ihe ndia ji dakwasim? n'ihi iba-uba nke ajọ omume-gi ka eji kpughe ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi, me ikiri-ukwu-gi abua ihe-ike.


Ya mere Mu onwem ji kpughe kwa ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-gi rue iru-gi, ewe hu nlelì-gi.


Mere onwe-gi ihe nile iji je biri n'ala ọzọ, gi ada nēbi n'Ijipt: n'ihi na Nof gāghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, esuresiwo kwa ya ọku, o we ghara inwe onye-obibi.


M'gēnye kwa ha n'aka ndi nāchọ ndu-ha, na n'aka Nebukadreza, bú eze Babilon, na n'aka ndi-orù-ya: ma emesia agēbi ya, dika o si di n'ubọchi nile nke mb͕e ochie; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọ bu kwa na Tehafnehes ka ubọchi gāb͕a ọchichiri, mb͕e M'gāb͕aji yoke nile nke Ijipt n'ebe ahu, npako nke ike-ya gākwusi kwa nime ya: ya onwe-ya, igwe-oji gēkpuchi ya, umu-ya ndinyom gāla kwa na ndọta-n'agha.


Ọ̀ bughi ndi di ka umu ndi Etiopia ka unu burum, unu umu Israel? ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta. Ọ̀ bughi Israel ka M'meworo ka ha si n'ala Ijipt rigoputa, na ndi Filistia site na Kaftoa, na ndi Siria site na Kia?


Gabigara onwe-unu, gi nwanyi bi na Shafia, n'ọtọ na ihere: nwanyi bi na Zeanan aputaghi; otiti-aka-n'obi nke Bet-izel gānapu unu ebe-nguzo-ya.


Ọbuná obodo ahu ka emere ka ọ je biri n'ala ọzọ, ọ lara na ndọta-n'agha: atupia-kwa-ra umu-ya nāṅu ara n'isi èzí nile: ọ bu kwa ndi di nsọpuru ya ka ha fekwasiri nzà, eke-kwa-ra ndi uku ya nkpọrọ.


Unu onwe-unu kwa, bú ndi Etiopia, ndi mma-agham b͕uru eb͕u ka ha bu.


aduam gi ọdú ka i zuru n'akam ọla-edo nke erechaworo n'ọku, ka i we ghọ ọgaranya; ka i zuru kwa uwe ọcha, ka i we bokwasi onwe-gi, ka ewe ghara ime ka ihere nke ib͕a-ọtọ-gi puta ìhè; ka i zuru kwa ọgwu-anya ite n'anya-gi, ka i we nāhu uzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan