Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 2:6 - Bible Nso

6 N'ihi na I rapuwo ndi-Gi, bú ulo Jekob, n'ihi na ha juputara n'ome-n'ala site n'Iru-anyanwu, ha bu kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ dika ndi Filistia, ọzọ, ha na umu ndi ala ọzọ nēkwekọ aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị, bụ ụlọ Jekọb azụ. Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ. Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia. Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 2:6
31 Iomraidhean Croise  

Ehazaia we dapu n'ihe-ọkpukpa window nke ime-ulo-elu-ya nke di na Sameria, o we ria ọria: o ziga ndi-ozi, si ha, Jenu, jua Beal-zebub, bú chi Ekron, ase ma m'gādiri ndu n'ọria nka.


Jehova we ju nkpuru nile nke Israel, weda ha n'ala, nye ha n'aka ndi nāpunara madu ihe, rue mb͕e O siri n'iru Ya chupu ha.


Sọl we nwua n'ihi nmekpu-ya o mekpuru megide Jehova, n'ihi okwu Jehova, nke ọ nēdebegh: ọzọ kwa, n'ihi na ọ juru ase n'aka onye nwere mọ ọ nāju ihe, iji ya ju ase,


o we pua izute Esa, si ya, Nurunum, Esa na Juda na Benjamin nile: Jehova nọyere unu, mb͕e unu nọyere Ya; ọ buru kwa na unu achọ Ya, Ọ gēme ka unu chọta Ya; ma ọ buru na unu arapu Ya, Ọ gārapu unu.


Mọ Chineke we were Zekaraia nwa Jehoiada, bú onye-nchu-àjà, kpuchie Onwe-ya dika uwe; o we guzo n'elu n'ebe ndi Juda nọ, si ha, Otù a ka Chineke siri; N'ihi gini ka unu onwe-unu nāgabiga ihe nile Jehova nyere n'iwu, ihe we ghara igara unu nke-ọma? n'ihi na unu arapuwo Jehova, Ọ rapuwo kwa unu.


Ọzọ, na mb͕e ahu ka m'huru ndi-Ju ndi lutara nwunye ndi bu ndinyom Ashdod na ndinyom Amon na ndinyom Moab:


Ma ha gwakọtara onwe-ha na mba nile nke ala ahu, We muta ọlu nile ha:


Ekwela ka nwayi-mb͕asi di ndu.


i we lutara umu-gi ndikom ufọdu nime umu-ha ndinyom, umu-ha ndinyom we so chi-ha nākwa iko, me kwa ka umu-gi ndikom soro chi-ha nākwa iko.


Nwam, ọ buru na i nọworo madu-ibe-gi na mbe, Ọ buru na i narawo onye ala ọzọ n'aka ibu onye-mbe,


Aṅurila ọṅu, gi Filistia, ka i ra, n'ihi na anyajiwo ndele nke nēti gi-ri: n'ihi na ihe nke gēsi na nkpọrọgwu agwọ puta bu ubí, nkpuru-ya gābu kwa agwọ yiri ọku nēfe efe.


Ma mb͕e ha gāsi unu, Juanu ndi nāju mọ ihe ase, ju-kwa-nu ndi-dibia-afa, ndi nēbe ka umu-nnunu, nātamu kwa ntamu: ǹdi ọ bula agaghi-aju Chineke-ya ase? ọ̀ bu n'ihi ndi di ndu ka agāju ndi nwuru anwu ase?


Otú a ka Jehova siri, Unu amutala uzọ mba nile, unu atu-kwa-la ujọ ihe-iriba-ama di iche iche nke elu-igwe; n'ihi na mba nile nātu ujọ ha.


Arapuwom ulom, ajuwom ihe-nketam; ewerewom nwayi nke ihe-ya nātọ nkpuru-obim utọ nke-uku nye n'ọbu-aka ndi-iro-ya.


N'ìhi gini ka I nēchezọ ayi rue mb͕e ebighi-ebi? N'ìhi gini ka I nārapu ayi rue ogologo ubọchi nile?


Unu echela ndi nāju mọ ihe iru, unu eche-kwa-la ndi-dibia-afa iru; unu achọputala ha, iwere ha meru onwe-unu: Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-unu.


Madu ahu kwa nke nēche ndi nāju mọ ihe iru, nke nēche kwa ndi-dibia-afa iru, iso ha kwa iko, M'gēdo irum megido madu ahu, bipu ya n'etiti ndi-ya.


M'gēbipu kwa obodo nile nke ala-gi, kwatue ebe-gi nile ewusiri ike:


M'gēbipu kwa n'aka-gi mb͕asi nile; i gaghi-enwe kwa ndi ji igwe-oji atù isi ọma na isi ọjọ:


Ọ gēru kwa, n'ubọchi àjà Jehova, na M'gēji nmehie ndi-isi, ji kwa nmehie umu eze, ji kwa nmehie ndi nile nēyi uwe ala ọzọ, leta ha.


O we tua ilu-ya, si, N'Eram ka Belak nēsi dutem, Eze Moab si n'ugwu Iru-anyanwu dutem: si, Bia, buaram Jekob ọnu, Bia kwa, wesa Israel iwe.


Ọ di nma; n'ekweghi-ekwe-ha ka anyakapuru ha, ma gi onwe-gi nēguzo n'okwukwe-gi. Atukwasila uche-gi n'ihe di elu, kama nātu egwu:


Ndi Filistia we kpọ ndi-nchu-aja na ndi nāju ase, si, Gini ka ayi gēme ib͕e Jehova? me ka ayi mara ihe ayi gēji zilaga ya n'ebe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan