Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 2:22 - Bible Nso

22 Rapunu madu, onye otù nku-ume di n'imi-ya: n'ihi na nìme gini ka aganāgu ya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi. O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime, nʼihi gịnị ka e ji agụnye ya?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 2:22
14 Iomraidhean Croise  

Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n'ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n'oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu.


ihe ọ bula nke ume nke mọ nke ndu di n'oghere-imi-ya abua, nime ihe nile ọ bula nke di n'ala-ọkpọ-nku, ọ nwuru anwu.


(N'ihi na ogologo mb͕e nile umem di nimem, Mọ nke Chineke di kwa n'imem;)


Unu atukwasila obi n'aru ndi amara aha-ha, Ma-ọbu n'aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere.


Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu, ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu: N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe; Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume.


Gini ka madu bu, na I nēcheta ya; Na nwa nke madu, na I nēleta ya?


Le, aguwo mba nile n'otù ntu-miri nātupu n'ite-miri, na n'uzuzu nke ihe-ọtùtù: le, Ọ nāchili agwe-etiti dika ifurifu-ihe.


Mba nile di ka ihe-efu n'iru Ya; dika ihe nērughi ihe-efu na ebe tọb͕ọrọ n'efu ka aguworo ha nye Ya.


Mu onwem, ọbuná Mu onwem, bu Onye ahu nākasi unu obi; ònye ka i bu, na i nātu egwu madu gānwu anwu, na i nātu egwu nwa madu nke agēme ka ọ di ka ahihia;


Otú a ka Jehova siri: Onye anābu ọnu ka nwoke ahu bu nke nātukwasi madu obi, we me ka anu-aru, bú madu, buru ogwe-aka-ya, onye obi-ya nēsi kwa n'ebe Jehova nọ wezuga onwe-ya.


Ma uḅu a ayi onwe-ayi nākpọ ndi-nganga ndi ihe nāgara nke-ọma; e, anēwu ndi nēme ihe-nmebi-iwu dika ulo; e, ha anwawo Chineke, ewe me ka ha wepuga onwe-ha.


ma unu bu ndi nāmataghi ihe gēme echi. Ǹdu-unu bu gini? N'ihi na unu bu alulu, nke nāputa ìhè nwa oge, emesia ọ we pua n'anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan