Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 19:2 - Bible Nso

2 M'gākwali kwa Ijipt megide Ijipt: ha gēbu kwa agha, onye ọ bula megide nwa-nne-ya, onye ọ bula megide kwa ibe-ya, obodo megide obodo, ala-eze megide ala-eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha. Nwanne ga-emegide nwanne ya, onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya; obodo ga-emegide isi obodo; otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 19:2
20 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ahu ekewara ndi Israel na nkera abua: otù nkera ndi Israel soro Tibni, bú nwa Ginat, ime ya ka ọ buru eze; nkera ọzọ soro Ọmri.


Ewe tipia ha, mba megide mba, na obodo megide obodo: n'ihi na Chineke were nkpab͕u nile chusa ha.


Ndi ahu gāchirita onwe-ha n'ihe-ike, otù onye megide onye ọzọ, na otù onye megide ibe-ya: ha gēbulite onwe-ha, nwa-okoro megide okenye, na onye anēlilì megide onye anāsọpuru.


Manase gēmegide Efraim, Efraim gēmegide kwa Manase: ndi ahu abua gēmegide Juda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Mba nile anuwo ihere-gi, iti-nkpu-gi juputa-kwa-ra uwa: n'ihi na dike asukwasiwo dike ngọngọ, n'otù ka ha dakọworo, ha abua.


Lezi-kwa-nu anya ka obi-unu ghara ilọ unu miri, ka unu ghara itu egwu n'ihi akukọ ahu nke anānu n'ala ahu; n'ihi na akukọ ahu gābia n'otù arọ, emesia n'arọ ọzọ akukọ ahu gābia kwa, ihe-ike gādi kwa n'ala ahu, onye nāchi achi nēmegide onye nāchi achi.


M'gākpọ kwa mma-agha ka ọ dakwasi ya n'ugwum nile, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta): mma-agha onye ọ bula ganēmegide nwa-nne-ya.


N'ihi na tutu ubọchi nile ahu ugwọ-ọlu madu adighi, ugwọ-ọlu anumanu adighi kwa; ọ dighi kwa udo diri onye nāpu apu ma-ọbu onye nābata abata site n'onye-nkpab͕u: eziga-kwa-ram madu nile, onye ọ bula imegide ibe-ya.


Nwa-nne gārara kwa nwa-nne-ya nye n'ọnwu, nna gārara kwa nwa-ya nye: umu gēbili kwa megide ndi muru ha, me ka ha nwua anwu.


ọ bu kwa ndi èzí-na-ulo madu gābu ndi-iro-ya.


Ma ebe Ọ matara ihe di ha n'obi Ọ si ha, Ala-eze ọ bula nke kewara megide onwe-ya, anēme ya ka ọ tọb͕ọrọ n'efu; obodo ma-ọbu èzí-na-ulo ọ bula nke kewa-kwa-ra megide onwe-ya agaghi-eguzo:


N'ihi na mba gēbili imegide mba ọzọ, ala-eze gēbili kwa imegide ala-eze ọzọ: oké unwu na ala-ọma-jijiji gādi kwa n'ebe di iche iche.


Ọzọ, ọ buru na ala-eze ekewa megide onwe-ya, ala-eze ahu apughi iguzo.


Ha we fùa ọgu opì-ike iri-na-ise ahu, Jehova we me ka mma-agha nwoke ọ bula di n'aru ibe-ya, na n'aru ọmuma-ulo-ikwū ahu nile: ọmuma-ulo-ikwū ahu we b͕alaga rue Bet-shita n'uzọ Zerera, rue uzọ Ebel-mehola, n'akuku Tabat.


Chinek we zite mọ ọjọ n'etiti Abimelek na ndi-nwe Shekem; ndi-nwe Shekem we ghọb͕ue Abimelek:


Ndi-nche Sọl nwere na Gibea Benjamin we hu; ma, le, ìgwè madu ahu b͕azere, we nēje iru na azu.


Sọl na ndi nile ya na ha nọ we kpọkọta onwe-ha, ba n'agha ahu: ma, le, mma-agha nwoke ọ bula digidere ibe-ya, oké ọb͕ub͕a-aghara uku we di.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan