Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 17:9 - Bible Nso

9 N'ubọchi ahu obodo-ya nile nke siri ike gādi ka ebe arapuru arapu nke oké ọhia na nke elu ugwu, nke ha rapuru n'iru umu Israel: ọ gābu kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 17:9
16 Iomraidhean Croise  

N'ihi na i chezọwo Chineke nke nzọputa-gi, na n'ihi na i chetaghi oké nkume ahu, bú ebe-gi siri ike; n'ihi nka ka i nāku ihe-ọkuku di iche iche nke di utọ, ọ bu kwa alaka osisi vine nke ala ọzọ ka i nāma nime ya:


Ma ọ gaghi-ele ebe-ichu-àjà ahu nile anya ọma, bú ọlu aka-ya, ọ bughi kwa ihe nkpisi-aka-ya meworo ka ọ gēle anya, ma ọ bu Asherim, ma-ọbu arusi-anyanwu-ya nile.


N'ihi na obodo ewusiri ike nọ nání ya, ebe-obibi ajuru aju na nke arapuru arapu, dika ọzara: n'ebe ahu ka nwa-ehi gāta nri, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ọ gāmakpu, richapu alaka-ya nile.


Nkpọtu gēbili kwa n'etiti umu-nna-gi, ọ bu kwa ebe-gi nile ewusiri ike ka agēbibi, dika Shalman bibiri Bet-abel n'ubọchi agha: nne n'elu umu-ya ka atupiara.


ebe nile di elu nke Aisak gātọb͕ọ kwa n'efu, ebe nsọ nile nke Israel gāghọ kwa nkpọnkpọ ebe; M'gēji kwa mma-agha bilie imegide ulo Jeroboam.


M'gēbipu kwa obodo nile nke ala-gi, kwatue ebe-gi nile ewusiri ike:


N'ihi na anēdebe ukpuru nile nke Ọmri, na ọlu nile nke ulo Ehab, unu ewe jeghari nime ndum-ọdu nile ha: ka M'we me gi ka i ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, me kwa ndi bi nime-ya ka ha ghọ ihe-ima-ọsọ; ọ bu kwa ita-uta ndim ka unu gēbu.


Ma ala nka gāghọ, ebe tọb͕ọrọ n'efu n'ihi ndi bi nime ya, site na nkpuru nke omume nile ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan