Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 17:4 - Bible Nso

4 Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agēme ka nsọpuru Jekob ghara inwe ike, ima-abuba nke anu-aru-ya gāta kwa ata.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 “Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala. Abụba dịkwa ya nʼahụ ga-atalata.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 17:4
15 Iomraidhean Croise  

Ma, le, ehi asa ọzọ nēsi n'osimiri Nail rigoputa n'azu ha, ha jọrọ njọ ile anya, ta kwa aru n'anu-aru-ha; ha we guzo nso ehi asa ọzọ ahu n'usọ osimiri Nail.


Ya ka Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide; Hoshea we ghọ orù-ya, butere ya onyinye-inata-iruọma.


N'arọ nke-iteghete nke Hoshea ka eze Asiria were Sameria, me ka Israel je biri n'Asiria, me ka ha biri nime Hala, na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, gēziga ọtita-aru n'etiti ndi-ya mara abuba: ọ bu kwa n'okpuru nsọpuru-ya ka agāmuye nmuye dika nmuye nke ọku.


Ọ̀ bu kwa gini ka unu gēme n'ubọchi nleta, na n'ila-n'iyì nke gēsi n'ebe di anya bia? Ònye ka unu gāb͕akuru ka o we yere unu aka? ọ̀ bu kwa ole ebe unu gārapu nsọpuru-unu?


Ọ bu nání na ọ makpuworo n'ọnọdu onye-nkpọrọ, ọ bu kwa n'ọnọdu ndi eb͕uru eb͕u ka ha gāda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Ebe ewusiri ike gāgwupu n'Efraim, ala-eze gāgwupu kwa na Damaskọs, ya na ndi Siria fọduru; dika nsọpuru umu Israel ka ha gādi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.


N'ihi na otú a ka ọ gādi n'etiti uwa n'etiti ndi nile, dika ntisisi nke osisi olive, dika nkpuru nke fọduru itutukọ, mb͕e ọghughọ-nkpuru-vine gwusiworo.


Site na nsọtu uwa ka ayi nuworo abù ọma di iche iche, ima-nma diri onye ezi omume. M'we si, Ọtita-aru dirim, ọtita-aru dirim, ahuhu dirim! ndi-nghọb͕u aghọb͕uwo; e, ihe-nghọb͕u ka ndi-nghọb͕u jiworo ighọb͕u.


Manase gēmegide Efraim, Efraim gēmegide kwa Manase: ndi ahu abua gēmegide Juda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Onye-nwe-ayi zigara okwu ba nime Jekob, o we dabà n'Iarael.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu, ọbuná Mu onwem, gēkpe kwa ikpe n'etiti anu mara abuba na anu tara aru.


Otú a ka Jehova siri: Dika onye-ọzùzù-aturu si anaputa ọlu-ukwu abua, ma-ọbu iberibe nti, n'ọnu ọdum; otú a ka agānaputa umu Israel ndi nānọdu ala nime Sameria na nkuku ihe-ndina, na n'elu nkisi ọma nke ebe anēdina.


Onye di egwu ka Jehova gābu n'imegide ha: n'ihi na Ọ gēme ka chi nile nke uwa ta aru; madu gākpọ kwa isi ala nye Ya, onye ọ bula site n'ọnọdu-ya, bú agwe-etiti nile nke mba nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan