Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 17:3 - Bible Nso

3 Ebe ewusiri ike gāgwupu n'Efraim, ala-eze gāgwupu kwa na Damaskọs, ya na ndi Siria fọduru; dika nsọpuru umu Israel ka ha gādi, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ebe e wusiri ike nke Ifrem agaghị adịkwa, ya na ike alaeze nke sị Damaskọs, ndị fọdụrụ nke Aram ga-adị ka ebube nke ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 17:3
27 Iomraidhean Croise  

Eze Asiria we ge ya nti: eze Asiria we rigorue Damaskọs, were ya, me ka ndi-ya je biri na Kia, o me-kwa-ra ka Rezin nwua.


N'arọ nke-iteghete nke Hoshea ka eze Asiria were Sameria, me ka Israel je biri n'Asiria, me ka ha biri nime Hala, na nime Haboa, n'osimiri Gozan, na n'obodo ndi Midia.


Kalno, ọ̀ dighi ka Kakemish? ma-ọbu Hemat, ọ̀ dighi ka Apad? ma-ọbu Sameria, ọ̀ dighi ka Damaskọs?


Ma ub͕u a Jehova ekwuwo, si, N'arọ atọ, dika arọ onye egoro ọlu, ka agēlelì nsọpuru Moab, ya na ìgwè madu-ya nile bara uba; ndi fọduru gādi kwa ntà nke-uku, nādighi ike.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agēme ka nsọpuru Jekob ghara inwe ike, ima-abuba nke anu-aru-ya gāta kwa ata.


N'ihi na I mewo ka obodo ghọ obo-ihe; I mewo ka obodo ewusiri ike ghọ ebe dara ada: I mewo ka ulo-elu nke ndi ala ọzọ ghara ibu obodo; rue mb͕e ebighi-ebi agaghi-ewu ya.


N'ihi na tutu nwa-okoro ahu amara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe, agārapu ala ahu nke ike eze-ha abua gwuworo gi onwe-gi.


N'ihi na isi Siria bu Damaskọs, isi Damaskọs bu kwa Rezin: ma tutu ọgu arọ atọ na ise eruzue agētipia Efraim, ka ọ ghara ibu otù ndi:


N'ihi na tutu nwata ahu amara ikpọ, si, Nnam, na, Nnem, agēbulaga àkù Damaskọs na ihe Sameria akwatara n'agha n'iru eze Asiria.


Jehova we si ya, Kpọ aha-ya Jezreel; n'ihi na ọ fọduru nwa mb͕e ntà, M'gēwere ọbara Jezreel leta ulo Jihu, M'gēme kwa ka ala-eze ulo Israel kwusi.


O we turu ime ọzọ, mua nwa-nwanyi. Jehova we si Hosea, Kpọ aha-ya Lo-ruhama: n'ihi na M'gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel ọzọ, ka M'we bupuru ha nmehie-ha ma-ọli.


Nkpọtu gēbili kwa n'etiti umu-nna-gi, ọ bu kwa ebe-gi nile ewusiri ike ka agēbibi, dika Shalman bibiri Bet-abel n'ubọchi agha: nne n'elu umu-ya ka atupiara.


N'ihi na ọtutu ubọchi ka umu Israel gānọdu nēnweghi eze, nēnweghi kwa onye-isi, nēnweghi kwa àjà, nēnweghi kwa ogidi, nēnweghi kwa ephod na teraphim:


Elodawo Israel: ub͕u a ha aghọwo ihe dika ihe nādighi-atọ utọ n'etiti mba nile.


Efraim, dika anu-ufe ka nsọpuru-ha gēfepu: ọmumu-nwa na idi-ime na itu-ime ewe ghara idi.


Ndi ji ikpe-ọmuma Sameria aṅu iyi, si, Chineke-gi nādi ndu, Dan; na, Uzọ Bia-sheba nādi ndu; ha gāda kwa, ghara ibili kwa ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan