Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 17:13 - Bible Nso

13 Mba di iche iche, dika nkpọtu nke miri di ike ka ha nākpọtu: ma Ọ nābasiri ya nba ike, o we b͕alaga n'ebe di anya, anāchi kwa ya dika ib͕ob͕o-ọka nke ugwu n'iru ifufe, na dika ihe anēfeghari buruburu n'iru oké ifufe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri, ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ. A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka, na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 17:13
33 Iomraidhean Croise  

Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe, Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori?


Si, Rue ebe a ka i gābia, ma i gaghi-agabiga ya; N'ebe a ka agākwusi kwa npako nke ebili-miri-gi nile?


Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di; Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa.


Ka ha di ka ib͕ob͕o-ọka n'iru ifufe, Ka mọ-ozi nke Jehova buru kwa onye nēnupu ha.


Onye nēme ka nkpọtu oké osimiri dajua, bú nkpọtu nmali-miri-ha, Ya na ùzù nke mba nile.


Ndi bi na nsọtu nile nke uwa we nātu egwu ihe-iriba-ama nile gi: I nēme ka ọpupu nile nke ututu na anyasi tie nkpu ọǹù.


I basiwo mba nile ọzọ nba, I mewo ka ndi nēmebi iwu la n'iyì, I hichapuwo aha-ha rue mb͕e nile ebighi-ebi.


na M'gētipia Asiria n'alam, ọ bu kwa n'elu ugwum nile ka M'gāzọ ya ukwu: yoke-ya gēsi kwa n'olu-ha wezuga onwe-ya, ibu-ya gēsi n'elu ubu-ha wezuga onwe-ya.


N'ihi na n'iru ọtutu mma-agha ka ha siri wagharia, n'iru mma-agha amiputara amiputa, na n'iru uta azọrọ ukwu ikwe ya, na n'iru ibu di arọ́ agha bu.


Ọ gāfukọtasi gi ike dika ihe-ọtutú tua gi n'ala sara mbara n'aka abua; n'ebe ahu ka i gānwu, ọ bu kwa n'ebe ahu ka ub͕ọ-ala nile nke nsọpuru-gi gādi, gi ihe-nlelì nke ulo onye-nwe-gi!


N'ubọchi ahu Jehova gēwere mma-agha-Ya di arọ́ di uku di ike ji nmehie-ha leta leviathan, bú agwọ nāb͕a ọsọ, na leviathan, bú agwọ b͕agọrọ ab͕agọ; Ọ gēb͕u kwa ogologo anu ahu nke di n'oké osimiri.


Ma ìgwè ndi ala ọzọ nēmegide gi gādi ka ájá di ntà, ìgwè ndi nēme ka madu ma jijiji gādi kwa ka ib͕ob͕o-ọka nke nāgabiga agabiga: ọ gādi kwa n'otù ntabi-anya na mberede.


iku-ume-Ya di kwa ka iyi nērubiga ókè, rue olu ka ọ nēkewa, iji yọ nke ihe-efu yọcha mba nile: bridle nke nēdufu edufu gādi kwa n'àb͕à ndi di iche iche.


Ya onwe-ya efewo-kwa-ra ha nzà, aka-Ya ewerewo kwa ya kère ha n'eriri-ọtùtù: rue mb͕e nile ka ha gēnweta ya, rue ọb͕ọ nile ka ha gēnwe ebe-obibi-ha nime ya.


Le, aguwo mba nile n'otù ntu-miri nātupu n'ite-miri, na n'uzuzu nke ihe-ọtùtù: le, Ọ nāchili agwe-etiti dika ifurifu-ihe.


E, akākughi ha dika osisi: e, akāghaghi ha dika nkpuru: e, ogwe-osisi-ha akāb͕aghi nkpọrọgwu n'ala: ọzọ kwa, O kukwasiwo ha ume, ha we kpọnwua, oké ifufe nēfepu kwa ha dika ahihia-ọka kpọrọ nku.


Le, ihere gēme ndi ahu nile ndi iwe-ha di ọku n'aru gi, agētiye ha n'ọnọdu-ihere: ha gādi ka ihe nābughi ihe, we la n'iyì, bú ndi nāluso gi ọ̀gù.


ọbuná n'ihi nka, le, Onye-nwe-ayi nēme ka miri Osimiri rigokwasi ha, bú miri nke di ike di kwa ọtutu, ọbuná eze Asiria na ebube-ya nile: ọ gārigokwasi kwa ebe-ya nile miri si erù, rusa usọ-ya nile:


Mb͕e ahu ka etipiara ígwè ahu na urọ na ọla ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu n'otù, o we di ka ib͕ob͕o-ọka sitere n'ebe-nzọcha-ọka nke mb͕e okpom-ọku; ifufe we fechapu ha, ewe ghara ihuru ha ebe ọ bula: nkume ahu nke tipiara onyinyo ahu we ghọ oké ugwu, juputa uwa nka nile.


N'ihi nka ka ha gādi ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu, dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēfechapu n'ebe-nzọcha-ọka, na dika anwuru-ọku si apu na window.


tutu ukpuru amuputa nwa, (ubọchi agabigawo dika ib͕ob͕o-ọka), mb͕e ọnuma nke iwe Jehova akābiakwasighi unu, mb͕e ubọchi iwe Jehova akābiakwasighi unu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan