Aịzaya 16:9 - Bible Nso9 N'ihi nka m'gēji ikwa-ákwá nke Jeza kwara osisi vine nke Sibma: m'gēji anya-mirim dè gi dika miri-ozuzo, gi Heshbon, na Eleale: n'ihi na n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu owuwe-ihe-ubi-gi ka iti-nkpu-agha daworo. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a9 Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza si akwa akwa nʼihi ubi vaịnị Sibma. Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ gị Heshbọn, na gị Eleale, nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ. Faic an caibideil |