Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 16:8 - Bible Nso

8 N'ihi na ubi nile nke Heshbon nātalata, ha na osisi vine nke Sibma; ndi-nwe mba nile ka osisi vine ya kachasi nma tib͕uworo; ọbumá na Jeza ka ha ruru, ha waghariri n'ọzara; alaka-ya wasara awasa, ha gabigara oké osimiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu; osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala. E, ndị eze mba dị iche iche azọdala ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ. E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza, ruokwa nʼọzara, nke mgbọrọgwụ ha gbasara ruo nʼọnụ osimiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 16:8
13 Iomraidhean Croise  

Unu ugwu Gilboa, Ka igirigi ma-ọbu miri-ozuzu ghara idikwasi unu, ma-ọbu ubi nke àjà-nbuli: N'ihi na ebe ahu ka asọrọ ọta ndi-dike oyi, Ọta Sọl dika agāsi na ọ bu onye anēteghi manu.


Ma ya onwe-ya, ọ bughi otú a ka ọ nēzube, obi-ya kwa, ọ bughi otú a ka ọ nēchè; kama ikpochapu ekpochapu di n'obi-ya, ya na ibipu ọtutu mba.


Heshbon nēti kwa nkpu, ya na Eleale: rue Jehaz ka anānu olu-ha: n'ihi nka ndi ejikere ibu agha nke Moab nētisi nkpu ike; nkpuru-obi-ya nāma jijiji nime ya.


N'ihi nka m'gēji ikwa-ákwá nke Jeza kwara osisi vine nke Sibma: m'gēji anya-mirim dè gi dika miri-ozuzo, gi Heshbon, na Eleale: n'ihi na n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu owuwe-ihe-ubi-gi ka iti-nkpu-agha daworo.


Manya-vine ọhu eruwo újú, osisi vine atalatawo, ndi nile nke nāṅuri ọṅu n'obi ezewo ume.


Ákwá nke kariri ákwá Jeza ka m'gākwara gi, gi osisi vine nke Sibma: alaka-gi nile gabigara oké osimiri, ọbuná n'oké osimiri nke Jeza ka ha ruru: n'elu nghọkọta-nkpuru-gi na n'elu nghọrọ-nkpuru-vine-gi ka onye nke nāpunara madu ihe daworo.


Moses we ziga iledo Jeza, ha we were umu-obodo-ya nile, napu ndi-Amorait ndi biri n'ebe ahu ala-ha.


Atarot, na Dibon, na Jeza, na Nimra, na Heshbon, na Eleale, na Seban, na Nebo, na Beon,


na Atrot-shofan, na Jeza, na Jọgbeha;


na Nebo, na Beal-meon, (ma ab͕anwere aha-ha,) na Sibma: ha we were aha kpọkwasi obodo ha wuru aha.


na Kiriataim, na Sibma, na Zeret-shaha n'ugwu ndagwurugwu ahu;


Ókè-ala-ha we buru Jeza, na obodo nile nke Gilead, na nkera ala umu Amon, rue Aroea nke di n'iru Raba;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan