Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 16:6 - Bible Nso

6 Ayi anuwo ihe bayere npako Moab, na ọ nāpako npako nke-uku; ọbuná ihe bayere nganga-ya, na npako-ya, na nrubiga-ókè-iwe-ya; ihe nēzighi ezi ka ekwukwu-ya nile bu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Anyị anụla akụkọ banyere Moab, nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile. Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi? Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 16:6
17 Iomraidhean Croise  

Onye-nganga na onye-npako, onye nākwa emò bu aha-ya, Ọ nālu ọlu n'iwe nērubiga ókè nke nganga.


Ibu ebero Moab. N'ihi na n'otù abali ka ebibiworo Ai nke Moab, me ka ọ la n'iyì; n'ihi na n'otù abali ka ebibiworo Kia nke Moab, me ka ọ la n'iyì.


Aghaghi ime anya npako nke madu ka ha di ala, aghaghi kwa iruda nbuli-elu nke ndi nile n'ala, aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu.


N'ihi na aka Jehova gānọgide n'ugwu a, ewe zọda Moab n'ọnọdu-ya, dika esi azọda okporo-ọka nime miri nke olùlù ikpo ǹsí-anu.


Ọ gāb͕asa kwa aka-ya abua n'etiti ya, dika onye nēgwu miri si ab͕asa aka-ya igwu miri: ma Ọ gēme ka npako-ya di ala, ya na ọlu-aghughọ nile nke aka-ya abua.


N'ihi na unu asiwo, Ayi na ọnwu ab͕awo ndu, ayi na ala-mọ ekweritawo kwa nkwa; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, ọ gaghi-abiakute ayi; n'ihi na ayi emewo ka okwu-ugha buru ebe-nb͕abà-ayi, ọ bu kwa n'okwu-ugha ka ayi zobeworo onwe-ayi:


Agēhichapu kwa ọb͕ub͕a-ndu unu na ọnwu b͕ara, nkwa unu na ala-mọ kweritara agaghi-eguzosi kwa ike; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, unu gāghọ-kwa-ra ya ebe-nzọda.


abum Onye nēmebi ihe-iriba-ama nile nke ndi-ekwukwu, M'nēme kwa ka ndi nāju ase wi ara; abum Onye nēme ka ndi mara ihe laghachi azu, M'nēme kwa ka ihe-ọmuma-ha ghọ ihe-nzuzu:


Ùnu si aṅa si, Ndi-dike ka ayi bu, na ndi bu dìnkpà ibu agha?


Menu ya ka ọ ṅubiga manya ókè; n'ihi na ọ bu Jehova ka o mere onwe-ya ka ọ di uku megide: Moab gāturu kwa onwe-ya n'ihe ọ b͕ọrọ, ọ gāghọ kwa ihe-ọchì, ọbuná ya onwe-ya.


Agēkpochapu kwa Moab ka ọ ghara ibu otù ndi, n'ihi na ọ bu imegide Jehova ka ọ meworo onwe-ya ka ọ di uku.


Mma-agha di n'ebe ndi-ekwukwu nọ, ha gāghọ ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha: mma-agha di n'ebe ndi-dike-ya nọ, ha gātu kwa ujọ.


Otú a ka Jehova siri: N'ihi njehie atọ nke Moab, e, n'ihi anọ, ka M'nāgaghi-eme ka ahuhu-ya laghachi azu; n'ihi na o surere ọkpukpu eze Edom me ka ha ghọ nzu:


Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan