Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 16:3 - Bible Nso

3 Dua ọdu, menu ihe ekpere n'ikpe; me ka ǹdò-gi di ka abali n'etiti oké ehihie: zobe ndi achupuru achupu; ekpughela onye nāwaghari.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,” “Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri. Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị nʼetiti oke ehihie. Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ, ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 16:3
18 Iomraidhean Croise  

o we rue, mb͕e Jezebel bipuru ndi-amuma Jehova, na Obadaia chiri ọgu ndi-amuma ise, zo ha, ọgu ndikom abua na iri n'otù ọb͕à, were achicha na miri zùa ha.)


mutanu ime ezi ihe; chọnu ikpé ziri ezi, menu ka onye nēme ihe-ike gazi agazi, kpenu nwa-nb͕ei ikpe ziri ezi, kpenu ọnu nwayi di-ya nwuru.


N'ihi na I buworo onye nēnweghi ike ebe siri ike, I buworo ob͕eye ebe siri ike nime nkpà nākpa ya, ebe-nb͕abà ipu n'oké miri-ozuzo, ǹdò ipu n'okpom-ọku, mb͕e oké ifufe nke ndi nēme ka madu na jijiji di ka oké miri-ozuzo nāmakwasi mb͕idi.


Otù onye gādi kwa ka ebe izonari ifufe, na ebe-nzuzo ipu n'oké miri-ozuzo; dika ọtutu iyi juputara na miri n'ebe kpọrọ nku, dika ǹdò nke oké nkume di elu n'ala nke kpatara ike-ọgwugwu.


Ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi puta, bú Jehova Nke nāchikọta ndi Israel achupuru achupu, Ọ si, Ndi ọzọ di kwa M'gāchikọtara ya, chikọtara ndi-ya achikọtara achikọta.


Ọ̀ bughi ikèsara onye agu nāgu nri-gi, ka i me kwa ndi ewedara n'ala ndi nāwaghari awaghari ka ha bata n'ulo-gi? mb͕e i huru onye b͕a ọtọ, ka i kpuchie ya: ka i ghara kwa izonari onye-aru-gi onwe-gi?


N'ihi na amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n'ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna Nke bu Nna mb͕e nile ebighi-ebi, Onye-isi Udo.


unu ulo Devid, otú a ka Jehova siri, Kpenu ikpe n'ututu, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u, ka ọnumam we ghara ipu dika ọku, ghara kwa ire ere nke ọ nādighi onye ganēmenyu ya, n'ihi ihe ọjọ nke omume nile unu.


Otú a ka Jehova siri: Menu ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, naputa-kwa-nu onye anapuworo ihe n'ike n'aka onye-nmeb͕u: unu emejọ-kwa-la ọbìa, ma-ọbu nwa-nb͕ei, ma-ọbu nwanyi di-ya nwuru, unu emela ha ihe-ike, unu awusi-kwa-la ọbara nēmeghi ihe ọjọ n'ebe a.


N'ihi nka, eze, kwe ka ndum-ọdum di gi nma n'anya, were kwa ezi omume tijipu nmehie-gi nile, were kwa imere ndi ewedara n'ala amara tijipu ajọ omume-gi nile; asi na ogologo mb͕e gādiri udo-gi.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha kwuru, si, Kpenu ikpe ezi-okwu, nwe-kwa-nu ebere na obi-ebere nile, onye ọ bula n'aru nwa-nne-ya:


n'ihi na agu gurum, unu we nyem ihe M'gēri: akpiri kpọrọm nku, unu we kuru miri nyem: abum ọbìa, unu we kpọbatam;


Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama.


Ogwu we si osisi nile, Ọ buru na ọ bu n'ezi-okwu ka unu onwe-unu nētem manu iburu unu eze, bianu, b͕abànu n'okpuru ndo nkem: ma ọ buru na ọ bughi n'ezi-okwu, ka ọku si n'ogwu puta, ripia osisi cedar nile nke Lebanon.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan