Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 16:2 - Bible Nso

2 O gēru kwa na, dika anu-ufe nke nēfefu efefu, dika akwu-nnunu achusara achusa, otú a ka umu-ndinyom Moab gādi na ngabiga-miri diri Anon.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ndị inyom Moab nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn na-akwụgharị dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 16:2
14 Iomraidhean Croise  

Ma Misha, bú eze Moab, bu onye-nwe ìgwè anu-ulo; o we tuara eze Israel utu aji nke orú nnù umu-aturu uzọ iri-na-abua na nnù iri, na nke orú nnù ebulu uzọ iri-na-abua na nnù iri.


Dika nnunu na nfeghari-ya, dika eleke n'ofufe-ya, Otú a nkọcha adighi-abia n'efu.


Dika nnunu nke nēsi n'akwu-ya efefu, Otú a ka madu di nke nēsi n'ọnọdu-ya akpafu.


Ọ gēru kwa, na ha gēche iru, onye ọ bula n'ebe ndi-ya nọ, ha gāb͕alaga kwa, onye ọ bula rue ala-ya, dika mb͕ada anāchu achu, na dika ìgwè ewu na aturu, nke ọ nādighi onye nāchikọta ha.


Emewo ka ihere me Moab; n'ihi na ọ tuwo ujọ: kwasie ákwá ike ti kwa nkpu; gosinu ya n'Anon, na emebiwo Moab.


Ahuhu diri gi, Moab! ndi Kemosh alawo n'iyì: n'ihi na achiriwo umu-gi ndikom la na ndọta-n'agha, achiriwo kwa umu-gi ndinyom la na ndọta-n'agha.


Nyenu Moab nkù, n'ihi na ọ ghaghi ifepu efepu: obodo-ya nile gāghọ kwa ebe tọb͕ọrọ n'efu, ghara inwe onye bi nime ha.


Ahuhu gādiri gi, Moab! I lawo n'iyì, gi ndi Kemosh: Ọ nyewo umu-ya ndikom, dika ndi b͕apuru ab͕apu, Nye kwa umu-ya ndinyom ije na ndọta-n'agha, N'aka Saihon, bú eze ndi-Amorait.


Site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo ahu nke di na ndagwurugwu ahu, we rue Gilead, ọ dighi obodo nke kariri ayi elu: ihe nile ka Jehova, bú Chineke-ayi, rara nye n'iru ayi:


Ala nka ka ayi nweta-kwa-ra mb͕e ahu: site n'Aroea, nke di n'akuku ndagwurugwu Anon, na nkera ugwu Gilead, na obodo nile ya, ka m'nyere ndi Reuben nye kwa ndi Gad:


Na mb͕e ahu ka ayi nara ala ahu n'aka eze abua nke ndi-Amorait ndi bi n'ofè Jọdan, site na ndagwurugwu Anon rue ugwu Heamon:


Ókè-ala ha nwere we di site n'Aroea, nke di n'usọ ndagwurugwu Anon, na obodo nke di n'etiti ndagwurugwu ahu, na ala di lari nile nke di n'akuku Medeba;


O we je ije n'ọzara, ga ala Edom na ala Moab buruburu, biarue akuku ọwuwa-anyanwu ala Moab, ha we ma ulo-ikwū-ha n'ofè Anon; ma ha abaghi n'ókè-ala Moab, n'ihi na Anon bu ókè-ala Moab.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan