Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 16:14 - Bible Nso

14 Ma ub͕u a Jehova ekwuwo, si, N'arọ atọ, dika arọ onye egoro ọlu, ka agēlelì nsọpuru Moab, ya na ìgwè madu-ya nile bara uba; ndi fọduru gādi kwa ntà nke-uku, nādighi ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 16:14
18 Iomraidhean Croise  

Ọ we nu okwu nile nke umu-ndikom Leban, si, Jekob achiriwo ihe nile nna-ayi nwere; o sitekwara n'ihe nna-ayi nwere kpata àkù a nile.


Heman we kọrọ ha akukọ bayere nsọpuru nke àkù-ya, na iba-uba nke umu-ya ndikom, na ihe nile nke eze ji me ka ọ di uku, nke o ji buli kwa ya ibu onye-isi nke ndi-isi na ndi-orù eze.


Lepu ya anya, ka o we kwusi, Rue mb͕e ubochi-ya gātọ ya utọ, dika onye egoro ọlu.


Ọ̀ dighi obubu-agha diri madu n'elu uwa? Ùbọchi-ya adighi ka ubọchi onye egoro ọlu?


Ha gēfedakwasi n'ubu ndi Filistia n'Ọdida-anyanwu; ha abua gādi n'otù luta ihe umu Iru-anyanwu n'agha: n'aru Edom na Moab ka ha ganēseti aka-ha; umu Amon ganānu kwa olu-ha.


Obim nētiri Moab nkpu; ndi-ọ̀sọ́-ya, nāb͕a ọsọ rue Zoa, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na nrigo Luhit, o ji ikwa-ákwá arigo na ya; n'ihi na n'uzọ Horonaim ka ha nētisi nkpu ntikpọ ike.


Nka bu okwu ahu nke Jehova kwuru bayere Moab na mb͕e gara aga.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na agēme ka nsọpuru Jekob ghara inwe ike, ima-abuba nke anu-aru-ya gāta kwa ata.


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi siworom, Tutu otù arọ agwu, dika arọ onye egoro ọlu si di, nsọpuru nile nke Kida gāgwusi:


Jehova nke usu nile nke ndi-agha ezubewo ya, ime ka npako nke ima-nma nile ghara idi nsọ, ime ka elelìa ndi-nsọpuru nile nke uwa.


N'ihi na aka Jehova gānọgide n'ugwu a, ewe zọda Moab n'ọnọdu-ya, dika esi azọda okporo-ọka nime miri nke olùlù ikpo ǹsí-anu.


Ọ gāb͕asa kwa aka-ya abua n'etiti ya, dika onye nēgwu miri si ab͕asa aka-ya igwu miri: ma Ọ gēme ka npako-ya di ala, ya na ọlu-aghughọ nile nke aka-ya abua.


N'ihi na tutu nwa-okoro ahu amara iju ihe ọjọ na irọputa ezi ihe, agārapu ala ahu nke ike eze-ha abua gwuworo gi onwe-gi.


Agēkpochapu kwa Moab ka ọ ghara ibu otù ndi, n'ihi na ọ bu imegide Jehova ka ọ meworo onwe-ya ka ọ di uku.


Otú a ka Jehova siri, Ka onye nke mara ihe ghara inya isi n'amam-ihe-ya, ka dike ghara inya isi n'idi-ike-ya, ka ọgaranya ghara inya isi n'àkù-ya:


kama i ghaghi isaghere ya aka-gi, i ghaghi kwa inye ya ihe gēzuru ukọ-ya nke kọrọ ya n'ọnọdu ihe-ibe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan