Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 15:5 - Bible Nso

5 Obim nētiri Moab nkpu; ndi-ọ̀sọ́-ya, nāb͕a ọsọ rue Zoa, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na nrigo Luhit, o ji ikwa-ákwá arigo na ya; n'ihi na n'uzọ Horonaim ka ha nētisi nkpu ntikpọ ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab, ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoa na Eglat Shelishiya. Ha na-akwa akwa dịka ha na-arịgo Luhit. Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim, ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 15:5
23 Iomraidhean Croise  

Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa.


na ha buru agha megide Bira, bú eze Sọdọm, megide kwa Biasha, bú eze Gọmọra, na Shainab, bú eze Adma, na Shemiba, bú eze Zeboyim, na eze Bila (nke ahu bu Zoa).


Me ngwa, wepuga onwe-gi je ebe ahu; n'ihi na apughm ime ihe rue mb͕e i gābà n'ebe ahu. N'ihi nka ka akpọrọ aha obodo ahu Zoa.


Ala ahu nile nākwa ákwá n'oké olu, ndi ahu nile nāgabiga kwa: eze nāgabiga kwa miri-iyi Kidron, ndi-ya nile nāgabiga kwa, n'iru uzọ ọzara.


Ma Devid nārigo na nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi-ya, ya onwe-ya nēje kwa b͕ara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra, nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá.


Ma ub͕u a Jehova ekwuwo, si, N'arọ atọ, dika arọ onye egoro ọlu, ka agēlelì nsọpuru Moab, ya na ìgwè madu-ya nile bara uba; ndi fọduru gādi kwa ntà nke-uku, nādighi ike.


N'ihi na otù ubọchi nke ọb͕ub͕a-aghara, na nke nzọda, na nke ib͕a madu ghari, ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, nwere, nime ndagwurugwu nke ọhù; ngwuda nke mb͕idi, na ntiku anētiku ugwu.


Ukwu-ha nāb͕a ọsọ ime ihe ọjọ, ha nēme kwa ngwa iwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ: èchìchè nile ha bu èchìchè ajọ ihe; nbibi na ntipia di n'okporo-uzọ nile nke ha.


Ma ọ buru na unu anughi ya, na nzuzo ka nkpuru-obim gākwa ákwá n'ihi npako-unu; anya-miri gāpu kwa n'anyam nke-uku, anya-miri ewe si n'anyam rùda, n'ihi na adọtara ìgwè aturu Jehova n'agha.


Ma mu onwem, anukpọghm ipu n'iso Gi n'izù aturu; ọzọ, ubọchi nādighi ngwọta, achọsighm ya ike; Gi onwe-gi mara: ihe si n'eb͕ub͕ere-ọnum puta, na ncherita-iru Gi ka ọ diworo.


Ngiri-afọm, ngiri-afọm! anamab͕ali na mb͕idi nile nke obim; obim nāsu udè nke-uku nimem; adighm-ab͕a nkiti; n'ihi na olu opì-ike ka i nuworo, nkpuru-obim, bú udà-opì agha.


Ntipia n'elu ntipia ka anākpọ; n'ihi na ebibiwo ala nka nile: na mberede ka ebibiworo ulo-ikwūm nile, n'otù ntabi-anya ka ebibiworo ákwà-nkwubam nile.


Ge nti olu iti-nkpu nke siri na Horonaim puta, ọ bu ipunara-madu-ihe na ntikpọ uku!


N'ihi na nrigo Luhit ka o ji ikwa-ákwá nārigo nākwa ákwá; n'ihi na nime nrida Horonaim ka ha nuworo nkpà nke iti-nkpu nke ntikpọ.


Site n'olu nke owuwe Babilon uwa mara jijiji, anuwo kwa iti-nkpu n'etiti mba nile.


Ugwu nile ayi ka m'gēbuliri ikwa-ákwá na igo-ákwá, buli-kwa-ra ebe-ita-nri nile nke ọzara abù-ákwá, n'ihi na esuresiwo ha ọku, ọ we ghara idi onye ọ bula nāgabiga; anughi kwa olu anu-ulo; ma anu-ufe nke elu-igwe ma anumanu ab͕alagawo, ha alawo.


Ahuhu gādiri gi, Moab! I lawo n'iyì, gi ndi Kemosh: Ọ nyewo umu-ya ndikom, dika ndi b͕apuru ab͕apu, Nye kwa umu-ya ndinyom ije na ndọta-n'agha, N'aka Saihon, bú eze ndi-Amorait.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan