Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 15:4 - Bible Nso

4 Heshbon nēti kwa nkpu, ya na Eleale: rue Jehaz ka anānu olu-ha: n'ihi nka ndi ejikere ibu agha nke Moab nētisi nkpu ike; nkpuru-obi-ya nāma jijiji nime ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa, a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz. Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa, mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 15:4
19 Iomraidhean Croise  

Rebeka we si Aisak, Ike ndum agwusiwom site n'iru umu-ndinyom Het: ọ buru na Jekob luru nwunye sitere n'umu-ndinyom Het, dika ndia, bú site n'umu-ndinyom ala nka, ùrù gini ka ndu baram?


Ma ya onwe-ya jere ije otù ubọchi n'ọzara, bia nọdu n'okpuru otù osisi broom: ọ riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, O zuwo; ub͕u a, Jehova, wepu ndum; n'ihi na mu onwem adighi nma kari nnam-hà.


N'ìhi gini kwa ka m'siri n'afọ nnem puta ihu ọnọdu ọjọ na nwuta, ewe ji ihere me ka ubọchim nile gwusia?


Ikpé abiaruwo kwa ala nke bu ala di lari; rue Holon, ru kwa Jahza, ọ biakwasiwo kwa Mefaat;


Site n'iti-nkpu Heshbon rue Eleale, rue Jehez ka ha mere ka olu-ha da, site na Zoa rue Horonaim, rue Eglat-shelishiya: n'ihi na ọbuná miri Nimrim gāghọ nání ebe tọb͕ọrọ n'efu.


Ha gārọputa kwa ọnwu kari ndu, bú ndi nile fọduru, ndi fọduru site n'ab͕uru ọjọ a, ndi fọduru n'ebe nile M'chusaworo ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke ndi-agha puta.


Ma ub͕u a, Jehova, biko, wepu ndum n'arum; n'ihi na ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


O rue, mb͕e anyanwu wara, na Chineke guputara otù ifufe Iru-anyanwu di ọku; anyanwu we tikwasi Jona n'isi, ike we gwusia ya, o we riọ Chineke ndu-ya ka ọ nwua, si, Ọ kam nma inwu ọnwu kari idi ndu.


Ma ọ buru na otú a ka Gi onwe-gi nēmem, biko, gbuziem, ọ buru na ahutawom amara n'iru Gi; ka m'ghara kwa ilekwasi ihe ọjọm anya.


Ma Saihon ekweghi ka Israel gabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, pua izute Israel rue ọzara, biarue Jehaz: ọ we buso Israel agha.


N'ihi na ọku esiwo na Heshbon pua, Ire-ọku n'obodo Saihon: O ripiawo A nke Moab, Ndi-nwe ebe nile di elu nke Anon.


Saihon we puta izute ayi, ya onwe-ya na ndi-ya nile, ibu agha, rue Jehaz.


na Jehaz, na Kedimot, na Mefaat;


N'ubọchi ahu madu gāchọ kwa ọnwu, ha agaghi-ahu kwa ya ma-ọli; agu inwu ọnwu gāgu kwa ha, ọnwu we b͕anari ha.


Ma Saihon atukwasighi Israel obi igabiga nime ókè-ala-ya: ma Saihon chikọtara ndi-ya nile, ha we ma ulo-ikwū-ha na Jehaz, o buso Israel agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan