Aịzaya 15:2 - Bible Nso2 Ọ rigowo n'ulo, ọbuná Dibon, n'ebe-ya di elu, ikwa ákwá: n'aru Nebo na n'aru Medeba ka Moab nākwasi ákwá ike: n'isi-ha nile ka nkwọcha-isi di, afu-ọnu nile ọ bula ka ebipuworo. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a2 Ndị niile bi na Dibọn na-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. Ndị Moab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba. Isi ha niile bụ isi nkwọcha, afụọnụ ha niile ka akpụchakwara. Faic an caibideil |