Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 14:3 - Bible Nso

3 Ọ gēru kwa, n'ubọchi Jehova gēme ka i zu ike pua n'ihe-nb͕u-gi, na n'ihe-nwute-gi, na n'òfùfè ahu siri ike nke emere ka i fè nime ya,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-eme ka ị pụọ site nʼihe mgbu na ihe mwute, sitekwa na ndọgbu onwe unu nʼọrụ nke ịbụ ohu unu wetaara onwe unu,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 14:3
17 Iomraidhean Croise  

Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na nkpọrọgwu Jesi, nke nēguzo ibu ọkọlọtọ ndi nile di iche iche, ya ka mba nile gāju ase; ebe-izu-ike-ya gābu kwa ebube.


I gāsi kwa n'ubọchi ahu, M'gēkele Gi, Jehova; N'ihi na ọ bu ezie na I wesaram iwe, ma iwe-Gi alaghachiwo azu, I we kasiem obi.


Ndim gānọ kwa n'ulo-obibi udo, na n'ebe-obibi di iche iche kwesiri ntukwasi-obi, na n'ebe-izu-ike di iche iche di jū.


Gwanu Jerusalem okwu gābà ya n'obi, kpọ-kwa-nu ya òkù, si, na obubu-agha-ya ezuwo, na ahuhu ajọ omume-ya atọjuwo Chineke utọ, na ọ natawo n'aka Jehova okpukpu abua n'ihi nmehie-ya nile.


I gārapu kwa, ọbuná site n'onwe-gi, ihe-nketa-gi nke M'nyere gi; M'gēme kwa ka i fè ndi-iro-gi n'ala ahu nke i nāmagh: n'ihi na ọku ka unu muyeworo n'iwem, rue mb͕e ebighi-ebi ka ọ gēre.


Ma gi onwe-gi, atula egwu, gi orùm, bú Jekob, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); atu-kwa-la ujọ, gi Israel: n'ihi na, le, M'gaje izọputa gi n'ebe di anya, zọputa kwa nkpuru-gi n'ala ọzọ ebe emere ka ha je biri; Jekob gālata kwa, nọ jū n'aru bū, ọ dighi kwa onye ganēme ka ọ ma jijiji.


Ọ gēru kwa n'ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), na M'gāb͕ajipu yoke-ya n'olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M'gētibì; ndi ala ọzọ agaghi-eme kwa ka ọ fè ha òfùfè ọzọ:


Onye-nb͕aputa-ha di ike; Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya: Ọ gēkpezu ọnu-ha, ka O we me ka uwa doro aru ala, me kwa ka ndi bi na Babilon me nkpatu.


Uke nke nādu adu agaghi-adi-kwa-ra ulo Israel ọzọ, ogwu nke nēb͕u nb͕u agaghi-adi kwa sitere na ndi nile nọ ha buruburu, ndi nēlelì ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Onye-nwe-unu Jehova.


Otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri: Ekwoworom Zaion oké ekworo, ejiwokwam oké ọnuma kworo ya ekworo.


M'gēme kwa ka ha bia, ha gēbi kwa n'etiti Jerusalem: ha gābu-kwa-ram otù ndi, Mu onwem gābu-kwa-ra ha Chineke, n'ezi-okwu na n'ezi omume.


i gēfè kwa ndi-iro-gi, ndi Jehova gēzì megide gi, n'agu, na n'akpiri-ikpọ-nku, na n'ib͕a-ọtọ, na n'ukọ ihe nile: ọ gētiye kwa yoke ígwè n'olu-gi, rue mb͕e ọ gēkpochapu gi.


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan