Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 14:25 - Bible Nso

25 na M'gētipia Asiria n'alam, ọ bu kwa n'elu ugwum nile ka M'gāzọ ya ukwu: yoke-ya gēsi kwa n'olu-ha wezuga onwe-ya, ibu-ya gēsi n'elu ubu-ha wezuga onwe-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 M ga-etipịa ndị Asịrịa nʼala m, nʼelu ugwu m ka m ga-anọ zọpịa ha nʼokpuru ụkwụ. A ga-ebupụ ibu arọ ya site nʼahụ ndị m, a ga-ewezugakwa ibu arọ ya site nʼubu ha.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 14:25
19 Iomraidhean Croise  

Jehova we ziga mọ-ozi, o we kpochapu ndi-dike nile bu dìnkpà, na ndi-ndú na ndi-isi, n'ọmuma-ulo-ikwū nke eze Asiria. O we were ihere iru laghachi n'ala-ya. O we ba n'ulo chi-ya, ndi siri na ngiri-afọ-ya we were mma-agha me ka ọ da nwua n'ebe ahu.


Ọ gēru kwa, mb͕e Onye-nwe-unu gālubì ọlu-Ya nile n'ugwu Zaion na nime Jerusalem, na M'gēleta nkpuru nke oké obi eze Asiria, leta kwa ima-nma nke anya npako ya.


Jehova anyajiwo nkpa-n'aka nke ndi nēmebi iwu, ndele nke ndi nāchi achi;


Ahuhu gādiri gi onye nāpunara madu ihe, ma gi onwe-gi bu onye anāpunaraghi ihe; onye nāghọb͕u kwa aghọb͕u, ma ha aghọb͕ughi gi! mb͕e i napubìri madu ihe, agāpunara gi ihe; mb͕e i ghọb͕ubìri, ha gāghọb͕u gi.


Rurupu onwe-gi, si n'ájá puta; bilie, nọdu ala, Jerusalem; tọpu onwe-gi ab͕u di n'olu-gi, gi ada Zaion adọtara n'agha.


N'ihi na yoke nke ibu-ya, na nkpa-n'aka nke ubu-ya, bú ndele nke onye nāchi ya n'ihe-ike, I nyajiwo ha, dika n'ubọchi nke Midian.


N'ebe ahu ka Asiria na nkpọkọta ndi ya nile di; n'ebe nile di ya buruburu ka ílì-ya nile di: ha nile bu ndi eb͕uru eb͕u, ndi daworo site na mma-agha:


N'elu ugwu nile nke Israel ka i gāda, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ndi di iche iche ndi nēso gi: udele nile di iche iche na anu ọhia ka M'gēwere gi nye, ka ha we rie gi.


Onye a gābu kwa udo: mb͕e Asiria gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ulo-elu nile ayi, ayi gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu asa na ndi-isi madu asatọ bilie imegide ya.


Ha gēji kwa mma-agha b͕uchapu ala Asiria na ala Nimrod n'ọnu-uzọ-ya nile: ọ gānaputa kwa ayi n'aka Asiria, mb͕e ọ gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ókè-ala-ayi.


Ma ub͕u a ka M'gāb͕ajipu nkpọrọ yoke-ya n'olu-gi, ọ bu kwa ab͕u-gi nile ka M'gētibi.


Ọ gāgabiga kwa n'oké osimiri nke nkpab͕u, tie oké osimiri nke ọtutu nmali-miri, ebe di omimi nile nke Nail gātakọrọ kwa: agēbuda kwa npako Asiria n'ala, nkpa-n'aka Ijipt gēwezuga kwa onwe-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan