Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 14:22 - Bible Nso

22 M'gēbili kwa megide ha, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta), M'gēbipu kwa na Babilon aha na ndi fọduru, na umu na umu umu; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Nʼihi na mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwupụtara sị, “Aga m ebili megide ha; aga m esitekwa na Babilọn bipụ aha ndị fọdụrụ, na ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 14:22
15 Iomraidhean Croise  

n'ihi nka, le, M'nēme ka ihe ọjọ biakute ulo Jeroboam, M'gēbipu kwa n'aru Jeroboam nwa-nwoke ọ bula, onye eb͕ochiri eb͕ochi na onye arapuru arapu n'Israel, M'gēkpochapu kwa nke fọduru nke ulo Jeroboam, dika madu si ekpochapu ǹsí-anu, rue mb͕e agēkpochapuzu ya.


Okwu-ọnu Jehova nile bu okwu-ọnu di ọcha; Ha bu ọla-ọcha anuchaworo n'ite-nnucha nke nērusa n'ala, Nke esichaworo ub͕ò asa.


Ncheta anēcheta onye ezi omume bu ihe-ngọzi: Ma aha ndi nēmebi iwu gēre ure.


Ha nēsi n'ala di anya abia, na nsọtu elu-igwe, bú Jehova na ihe-agha nile nke oké iwe-Ya, emebi ala nka nile.


ma, le, ub͕u a ka usu madu nābia, ndi-inyinya nēje abua abua. O we za, si, Ọ dawo, Babilon adawo; ọzọ, arusi nile apiri api nke chi-ya nile ka etipiaruworo ala.


Otú a ka Jehova siri, bú onye-nb͕aputa-unu na Onye Nsọ nke Israel: n'ihi unu ka M'ga-eziga ozi na Babilon, M'gēme kwa ka ha rida dika ndi-ọ̀só, ha nile, ọbuná ndi Kaldea, n'ugbọ nile nke iti-nkpu-ọṅù-ha.


N'ihi na otù mba esiwo n'Ugwu rigoputa imegide ya, mba ahu gēme ka ala-ya ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu, ọ dighi kwa onye ganēbi nime ya: ma madu ma anumanu, ha awaghariwo, la.


Jehova enyewo kwa iwu bayere gi, ka aghara igha kwa nkpuru ọ bula ọzọ nke sitere n'aha-gi: n'ulo chi-gi nile ka M'gēbipu arusi apiri api na arusi awuru awu; M'gēdo ílì-gi; n'ihi na elelìwo gi anya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan